A NỌ na Holy Family Spiritual Year Seminary, Okpuno, nke di n’okpuru ọchịchị Awka South na nso nso a wee yinye ụmụokorobia iri na asaa na-achọ ichi fada akwa ọcha. A kporo nke a ‘2018 Investiture’. Dika o si dị, emume ahụ bụ ome n’afọ nke a na-eme n’ụlọakwukwọ ahụ.
N’okwuchukwu ya n’aja maasi dị asọ; bishọpụ ụka katolik nke Awka dayọsis bụ ‘Most Rev’ P.C. Ezeokafor gwara ha ka ha kee ajị n’ụme wee nabata ọzụzụ a na-enye ha. O kwuru sị na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị e jị echeta itụ ime Marịa di asọ n’ejighị njọ ọbụla.
Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha nabata ọzụzụ nke a na-enye ha maka ịbu ụkọchukwu dika Maria si nabata ịbụ nne nke Chukwu. Ọ gwara ha sị: “Onye mekata ihe ọma, ahụ ya abụrụ ihe ọma. A na-ebido n’oge ebi ezigbo ndụ makana anaghi amụ aka ekpe na nka. Onye ga-abụ fada ga-abụ ezigbo mmadu n’ihi na onye isi anaghị edu onye isi. Ọ dị mma ka mmadụ yie aha a gụrụ ya”.
Bishọpụ Ezeokafor gakwara n’ihu gwa ha ka ha jiri oge a kpọrọ ihe na ihe ndị uka chọrọ n’aka ụkọchukwu bụ okwu nke Chineke na sakaramenti. O ji ohere ahụ dụkwa nne na nna odụ ka ha nye aka n’ikwado ụmụakwụkwọ ahụ site n’ileru ha anya ma na-adụ ha odụ n’oge ezumike.
N’okwu nke ya, onye isi ụlọakwukwọ ahụ, ‘Rev Fr’ Paul Mary Chukwukebe kelere Chineke maka onyinye nke okwukwe. O kelekwara bishọpụ maka mmemme ahụ, tinyekwara nkwado ya na ya bụ ụlọakwukwọ ma dụkwa ndị nne na nna ha ọdụ ka ha na-enye aka n’izụ ụmụ ha ma ha lọta ụlọ oge ezumike.
‘Fr’ Chukwukebe kelekwara ụkochukwu na-enyere ya aka n’ọlụ bụ ‘Fr’. Alex Okoye maka ọlụ ọma ya niile, tinyekwara ndi ụkọchukwu ndi ọzọ dịka Fr Francis Chidume na Fr Cyril Ezeani.
Onye kwuru okwu n’aha ndị nne na nna bụ Oriaku Stella Mary Uzoukwu rụtụrụ aka mkpa ọ dị ịkpere ndị na-achọ ichi ụkọchukwu ekpere ma na-agwakwa ha okwu ga na-agba ha ume.
Umuakwụkwọ ahụ n’ozi ekele ha nke Justin Umeozor gụpụtara jiri obi añurị kelee Chineke, bishọpụ, ndi nlekọta ha, nne na nna na mmadu nile, ebe John Paul Okoye na nkata ya na onye nta akụkọ anyi kpara kwuru na ya ji obi ocha wee nabata mmemme ahu.