AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwupùtala njikere ọchịchị steetiahụ dị ịgbata ọsọ enyemaka nyegara ndị ahụ ajọ ọnọdụ iju mmiri wakpórò na steeti ahụ aka ka ha wee nọrọkwa n’ezi ọnọdụ karịa ka ha nọ na mbụ.
Nke a bụ nke gọvanọ mere ka a maran’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, na mmemme ịgbape kpọmkwem amụmà Mgbata Ọsọ Na Enyemaka Nye Ndị Nsogbu Iju Mmiri Wakpòrò Na Steeti Ahụ Nke Afọ 2018, bụ nke e mere n’okpuru nkwàdo ndị “Bright Vision Health Foundation” (BVHF) na njikọ aka ndị “Church of Jesus Christ of Latter-Days Saints”
Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ osote ya, Dr. Nkem Okeke, mèrè ka a mara na ọchịchị steeti ahụ, site n’aka ụlọ ọlụ steeti ahụ na-ahụ maka ọnọdụ gbanụgbanụ, bụ Anambra State Emergency Management Agency (SEMA) agaala n’ihu n’inyere ndị ahụ iju mmiri wakporo aka kemgbe ya bụ ihe jiri mee, ma sịkwazie na ọchịchị ya agaghị ada mbà n’ime nke ahụ.
Ọ kọwara mgbata ọsọ enyemaka ahụ dịka nke bịara n’oge dabara adaba, ọ kachasị ugbu a oge mmemme ekeresimeesi na-akpụdòbe nso, ma kpọkùkwazie ọhanaeze ka ha gaa n’ihu n’ichèta ndị ahụ na ịgbatara ha ọsọ enyemaka, dịka mmiri bibìsigoro ihe ha jiri biri.
N’okwu ha n’otu n’otu, onyeisi BVHF, bụ onye nnọchi anya Adaobi Dozie, na onyeisi ụlọ ụka “Church of Jesus Christ of Latter-Days Saints” bụ maazị Peter Ezeigwe kwuru na ya bụ ọrụ obi ebere ha bàgidere bụ iji nye aka na mbọ ọchịchị steeti ahụ na-agba n’ime ka ọnọdụ kara ndị ahụ mma, ma kwe nkwà na ha ga-aga n’ihu n’ime nke ahụ na inyekwa ndị ahụ nkwàdo n’ụzọ ọbụla dị iche iche ha nwèrè ike.
Ihe dị iche iche e buteere ndị ahụ gụnyere akpa osikapa, mmanụ e ji esi nrị na nke e ji eghe ihe oghighe, àkwà edina, igbe nri fụrị fụrị bụ indomie, ihe dị icheiche e ji esi nri, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.