OBODO juputara nnọọ n’ọñụ ụbọchị Mọnde na steeti Anambra dịka gọọmenti steeti ahụ nyere ndị ntorobịa karịrị iri ise na steeti ahụ nkwàdo na akụrụngwa dị iche iche iji wee malite ọlụ aka dị iche iche ha mụrụ.
Nke a bụ nke e mere site n’okpuru ministịrị steeti ahụ na-ahụ maka nkwàlitè ndị ntorobịa na akụnụba nke ihe e ji aka emepụta; n’ịgbaso mmezupụta nke atụmatụ “otu onye ntorobịa, otu ọlụ aka”, bụ ọmarịcha atụmatụ aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ ji n’aka ugbu a, ịhụ na onye ntorobịa ọbụla na steeti ahụ nwere, o pekata mpe, otu ọlụ aka.
N’okwu ya dịka ọ na-enyefè ihe ndị ahụ n’aka ndị ntorobịa ahụ, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka nkwàlitè ndị ntorobịa na akụnụba nke ihe e ji aka emepụta, bụ Maazị Bonaventure Enemali kọwara nke ahụ dịka nke dabàrà adaba na nkwà ahụ Gọvanọ Willie Obianọ kwèrè ikwàdo ndị ntorobịa puku iri na steeti ahụ kwa afọ ọbụla ka ha bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha, ma mee ka a mara na e nyebuọla ndị ntorobịa ruru narị abụọ na iri ise nkwàdo n’oge gara aga, n’agba nke mbụ nke atụmatụ ahụ.
Ọ sị na gọọmenti lekwàsịrị anya n’ọlụ aka dị iche iche ndị ahụ nwere mmasị na ya, iji hụ na ha mụtara ya nke ọma, ma kọwaa Gọvanọ Obianọ dịka enyi ndị ntorobịa, bụ nke mere o jiri mee ka amụma ego ọlụ nke afọ 2019 gbakwàsa ụkwụ na nkwàdo ndị ntorobịa na òtitó ha, bụ nke o nwebeghị na steeti e mere ya kemgbe okike ala Nigeria.
N’akụkụ nke ya, ode akwụkwọ ọkpụtọrọkpụ nke ministịrị ahụ, bụ Oriakụ Stephanie Karie-Ụzọr bunyere Gọvanọ Obianọ ụkpa èkèle maka ọmarịcha atụmatụ ahụ, bụ nke ọ sị na o nwebeghị ọchịchị mere ya na steeti ahụ, ma kọwakwa na ọ ga-enye aka ime ka ndị ntorobịa sepù aka n’ihe na-ebute ala adịghị mma n’obodo ahụ, ma bàára onwe ha na obodo uru.
Ọ gakwazịrị n’ihu kpọkuo ha bụ ndị ritara uru na ya bụ amụmà ka ha were ya kpọrọ ihe, leruo ha anya nke ọma, ma wèrekwa ya baara onwe ha urù.
Ndị ntorobịa ahụ bụ ndị a gụpụtasịrị site n’ime ọgbọ nta nkwàdo sineeti atọ e nwere na steeti ahụ, ma bụrụkwa ndị e nyere ọzụzụ n’ọrlụ aka dị iche iche, nke gụnyere: ighe ihe oghighe, ịchọ mma, ịrụzi igwe omecha ncha bụ kọmputa, iji igwe kọmputa eme ọtụtụ ihe n’usoro ọgbara ọhụrụ dijitaalụ, ite ụlọ, ịkụ ihe ọkụkụ, tinyere ọtụtụ ọlụ aka ndị ọzọ.