OGE ekeresimesi bụ oge e ji eme njem nke ukwu. Nke a mere na ụgbọala na-eju n’okporo ụzọ tinyere ọkada na ihe ọnyịnya ndị ọzọ.
A chọpụtara na ihe mberede na-adapụtaba n’oge a n’ihi ihe olemole.
Ọtụtụ ndi na-akwọ ugbọala anaghị enwe ọzụzụ tupu ha eburu ụgbọala pụta n’okporoụzọ. Mgbe mmadụ amụghị ihe otu ibe ya si mụ, ihe ọzọ na-eso ya bụ ọghọm. A na-ekwu na ha enweghị ọzụzụ ha a na-anyakwa ọgbasara m site n’ịnya waa waa waa. Otụtụ n’ime ha anaghị eleru anya were na-anya, ọ bụrụ na ndị na-akwọ ụgboala ga na-enwecha ọzụzụ ma na-eleru anya ala, a ga-egbochinwu ọtụtụ ihe mberede na-eme n,okporoụzọ anyi.
Ihe ọzọ dị ka ibe ya bu na ụfọdụ anaghị alụ ụgbọala ha ọlụ bido n’afọ ruo n’afọ. Mgbe ufọdụ ka ọkwọ ụgbọala ga-ama na ụgbọala ya adịghị mma ma buru ya pụta n’okporoụzọ. O bụrụ na a na-alụ ụgbọala ọlụ otu o kwesịrị, ọ ga-ebelata ihe mberede. Iji ma atu, ọ bụrụ na ụgbọala enweghị ọkụ o ji ahụ ụzọ, ahapụ ibu ya pụta n’abalị, ọ gaghi akpata ihe mberede.
Ihe ọzọ ga-enye aka ibelata ihe mberede n’oge ekeresimesi a bụ ndị mmadu ịkwụsị oke ime na ọ dị ha ọsọ ọsọ. O bụ n’ihi ọsọ ọsọ ndị mmadụ na-eme so n’ihe na-akpatakari ihe mberede n’oge a. Mgbe ụfodụ ka mmadụ na-atụfụ ndụ ya n’ihi na ọ di ya ọsọ ọsọ.
Mgbe ihe ọjọọ (ihe mberede) dapụtara, onye ahụ agaghịzị adị ndụ ma ya fọzie iru ebe ahụ ọ na-aga nke di ya ọsọ ọsọ. Ozọ bụ na ndi mmadụ ga-ahapụ ị na-aza ekwentị mgbe ha na-anya ụgboala n’ihi na o sokwa n’ihe na-akpata ihe mberede. Mmadụ agaghị na-anya ụgbọala na-aza ekwentị n’ihi na ọ nweghị uche naabọ. Onye ọbụla na-anya ụgbọala ga-ahapụ ekwentị ka o wee gbanarị ihe mberede.
A bia na steeti Anambra ugbu a, aka na-achi steeti ahụ bụ Willie Obiano (Akpọkuodike) e tinyela ndị ọlụ n’okporoụzọ bụ ndị na-amachicha olulu ‘portholes’ iji belata ihe mberede. Ihe ndị a nile bụ iji hụ na ekeresimesi gara n’udo.
Ihe ọzọ dika ibe ya bụ ihe nrụtụ aka a na-etinye n’okporoụzọ. Nke a bụ ihe ọzọ ga-enye aka ibelata ihe mberede, ma n’okporouzo goomenti etiti ma na nke seeti. O bụ ihe nrụtụaka a na-egosi ọnọdụ ụzọ na otu o si dịrị. Ọ bụrụ ebe ụzọ gbara ngọ, ọ kọwaa, o ruo ebe ahịa dị, ọ kọwa, w.d.g. mana ajụjụ bụ ndị ọ kwọ ụgbọala ole na-agụ ihe ndị a. O dikwa ezi mkpa na ndi ọkwọ ụgbọala ga-amata ihe ndi a.