AKA na-achị Steet Anambra bụ Govanọ Willie Obiano atọhapụla ndi nga mmadụ iri bụ ndị nọ n’ụlonga ‘Aguata Prisons’ nke di n’Ekwulobia n’okpuru ọchịchị Aguata nke Steeti ahụ.
Obianọ mere nke a mgbe o sonyere n’aja maasi di aso nke ọ bụ ‘Most Rev’ Jonas Benson Okoye ‘Auxilliary Bishop’ ụka Katọlik dayosis Awka nọ n’isi ya, ma bụrụ nke e merubere n’ogige ụlọnga ahụ.
Ndị nga ndị ahụ a gbaghaara ma tọhapụ bụ Ebuka Eze, Monday Oweh, Chinedu Nwigwe, Onyeka Obi, Emeka Ezechukwu, Obinna Nwankwo, Emmanuel Onyenwusi, Chigozie Nwankwo, Chukwuebuka Okonkwo na Ogechi Onyeanwụsị.
Ndị nga ndị ahụ bụ ndị a tụrụ nga n’ihi izu ohi na igwu ojoro ma bụrụkwa ndị nọrọla site n’agbata ọnwa isii wee ruo afọ abụọ n’ụlọnga.
Govanọ Obiano kwuru na ha ga-aputa n’ụlọ nga ma ya binyechaa aka n’akwụkwọ dịka o kwesịrị. O dọkwara ha aka na ntị ka ha gbanwoo agwa ha mgbe ha banyere n’obodo.
O gwakwara ndị nke ka nọ na nga ka ha na-aga n’ihu n’ikpa agwa ọma ma rụtụkwa aka na n’ime mmadu narị abụọ na iri na asatọ nọ n’ụlọnga ahụ na mmadụ otu narị na iri ise ka na-eche ikpe ha. O kwere ha nkwa ịnwa oko ya n’ebe ụlonga ahụ dị site n’ileru anya na mkpa ha dika igwe na-enye ọkụ, okporoụzọ ụlọnga ahụ, ụgbọala bọosu na ihe ndị ọzọ,n’agbanyeghị na ha dị n’aka goomenti etiti.
N’akukụ nke ya, Mazi Emmanuel Nwakeze bụ onye isi ụlọnga na Steeti Anambra kelere Gọvano Obianọ maka enyemaka ya mgbe nile n’ụlọnga dị n’Anambra. O tokwara onye ọlụ nọ n’isi n’ụlọnga Agụata maka ọlụ ọma ya nke mere na enweghi ọgbaaghara obụla n’ụlọnga ahụ.
N’okwuchukwu nke o kwuru n’aja maasi na mbido, Bishọpụ Jonas-Benson Okoye kwuru na a mụrụ mmadụ n’ụwa n’enweghị ihe nkedo ọbụla, ma dụọ ndịnga ahụ na ndị ụka ọdụ maka eziomume. O gara n’ihụ kelee govanọ maka enyemaka ya mgbe nile.
Mazi Patrick Ubenyi, onye isi ụlọnga Aguata, dika ọ na-akọwapụta mkpa ha, kelere goomenti Steeti Anambra na ndi ụka n’ihi mbọ ha nke nyere aka ibelata arụ na Steeti ahụ.
Oriaku Ebelechukwu Obiano (Osodieme), nwunye aka na-achi Steeti Anambra, tinyere ọtụtụ ndi ọzọ so govanọ mee njem ahụ.
E nyere ndi nga ahụ onyinye di iche iche. Bishop nọkwa na ya kwọọ mmadu iri na ise aka n’isi.