AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ agaala leta ka ọnọdụ sìrì gbata kwụrụ na otu ọlụ si aga n’okporo ụzọ ahụ siri Umụnankwọ gaa Mpụtụ wee pụta Ogwụaniọcha.
N’okwu ya n’ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ gosìpụtara afọ ojuju ya bànyere otu ya bụ ọlụ sì aga n’okporo ụzọ ahụ dị kilometer iri na anọ na ụma isii; ma nyekwazie ụlọ ọlụ ji ya ntụzi aka, ka a gbàkwụnye àkwà mmiri ga-ejikọta Ihiala na mpaghara okpuru ọchịchị Ọgbarù ahụ.
O mere ka a mara na ọchịchị ya bàgìdèrè na ya bụ ọlụ iji hụ na e nwere ezi okporo ụzọ n’ime obodo ndị ahụ, dịka ọ dị n’ụfọdụ ime obodo ndị ọzọ dị ichè ichè na steeti ahụ; ma kpọkùkwazie ụlọ ọlụ ji ya bụ ọlụ ka ọ gbasie mbọ ike ịhụ na a rụchapụrụ ya bụ ọlụ n’oge a tụrụ anya.
N’okwu nke ya na njèm ahụ, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọlụ, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọ kwuru na ya bụ ọlụ na-aga nke ọma nakwa n’ogoogo dị elu, ma sịkwa na onye ji ya bụ ọlụ ngo emeela ka a mara na a ga-awụrú ya bụ ụzọ n’obi eze ọdịnala obodo Ogwụaniọcha tupu oge mmemme Ekeresimeesi eruo. Ọ dụrụ onye ji ọlụ bụ Maazị Toni Madi, nke ụlọ ọlụ TAMAD ka ha gbaa mbọ ịrụchapụ ya n’oge a tụrụ anya, bụkwa nke o kwètàrà.
Na ntụnye ya, eze ọdịnala Ogwụaniọcha, bụ Igwe Oliver Nnaji, tòrò Gọvanọ Obianọ maka ịgbatara ha ọsọ enyemaka, kwe ya nkwa na ha ga-aga n’ihu n’inye ọchịchị ya nkwàdo, ma rịọkwazie ya ka o mee ka a hụ na a rụchara ya bụ ọlụ tupu oge ọchịchị ya agwụ
Ndị ọzọ selitere isi na mpaghara ahụ kwúrú okwu na ya bụ ọgbakọ gụnyere okwupụta okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ n’oge gara aga, bụ Oriakụ Chinwe Nwaebili na Chiifu Chinedu Emeka, bụ ndị kpọkùkwàrà ọhanaeze ka ha nọgidesie ike n’ịkwàdò otu ndọrọ ndọrọ APGA iji wee gaa n’ihu n’ịkwalite ọdịmma ha.