AKA akparala otu nwoke aha ya bụ Solomon Okon, bụ onye buuru ụgbọala nne ya ukwu wee gbalaga. Oriakụ Olufunke Obaba kwuru na ya were Okon n’ọlụ dika ọkwọ ụgboala ya ‘private driver’ mana o rughi otu ọnwa, o zuru ụgboala ahụ gbapụ.
Oriaku Obaba kwuru na o bugara ya ụlọgwụ ebe ọ gara inyocha ahụike ya, ma si ebe ahụ fuo. O kwuru sị: “Anyi ruru ụlọgwụ n’ihe dika elekere asatọ na ọkara nke utụtụ. Ebe ihe dịka awa abụọ na ọkara gachara, apụtara m, ahụghikwa m ụgbọala m ebe a kwụbara ya.
Akpọrọ m ya n’ekwentị ya nile ma onweghi nke gara aga. Akpọzịrị m di m, o wee bịa, bughachi m azụ n’ofiisi. Echere m na Okon bu ugboala ahụ gaa mkpagharị, ma mgbe o ruru n’etiti elekere nke atọ na anọ nke mgbede ma anyi ahụghị ya, anyị gara kpesara ndị uweojii”.
Dika kọmishona Uweojii na Steeti Oyo bụ Abiodun Odude si kwu mgbe a na-akpọgharị onye ohi ahụ n’isi obodo ahụ; o bụ site na mbọ ndị uweojịị mgbe ha nwetechara ozi site n’aka nwanyị nwe ụgbọala n’Ibadan ka ha ji nwụchikọọ onye ohi ahụ n’Akwa Ibom