NDI Uweojii nke Steeti Ebonyi na-enyocha ihe banyere ọnwụ otu nwanyị nke a hụrụ ozu ya n’otu ụlọ oriri na ọñụñụ nke di n’Afikpo ‘Road’ Abakaliki.
Ozi e nwetara n’Abakaliki site n’aka onye okwuputa okwu bụ Lovet Odaa na-akọwa na ozu nwanyị ahụ nwere ọnya n’obi ya na n’olu ya; ma na-ekwu na ndị ọlụ ụlọ oriri na ọñụñụ ahụ amaghị mgbe nke ahụ mere n’ihi na ọ bụ mgbe ozu ahụ bidoro sibe isi ka e ji chọpụta.
Odaa kwuru sị: “Amatabeghị onye nwanyị ahụ bụ nke a na -amata onye gburu ya mana a na-eme nnyocha ugbu a. A ga-ata ndị ọlụ ụlọ oriri na ọñụñụ ahu ụta n’ihi elerughị anya makana achọpụtaghị igbu ọchụ ahụ ozigbo. A chọpụtara nke a ka abali ole na ole gachara”. Ọ rịọrọ ọha na eze ka ha nye aka weta ozi nke a ga-eji nwuchikọọ onye kpara arụ ahụ ma kwekwa nkwa na ndị uweojii ga-ahụ isi ya bụ okwu.
O kwukwara na ka ọ di ugbu a, ndi ọlụ ụlọ oriri na ọñuñụ ahụ bụ ndi a na-agbazi ajụjụ maka ya bu ọdachi.
Otu onye achọghi ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ bụ mgbe isi ọjọọ ji pụtawa n’ọnụ ụlọ ahụ ka ndi ọlụ ụlọ oriri na ọñụñụ ahụ ji chọputa. O kwụru sị: “Mgbe isi ahụ ekweghịzị odidi ka m gwara onye nlekọta ‘manager’. Mgbe ahụ ka e ji chọpụta na a sụgbuola nwanyị ahụ. O nwere ike ibụ enyi ya nwoke sụgburu ya. Onye nlekọta ahụ kpọrọ ndị uweojii. Mgbe ndi uweojii bịara, ha kpọọrọ ndị ọlụ ahụ gawa maka nnyocha.”
ọ gakwara n’ihu kwuo na a chọputara na ozu nwanyị ahụ nwere ọnya n’obi, olu na akụkụ ahụ ndị ozọ, ma kọwaa na onye gburu nwanyị ahụ weere ihe ya dika ekwentị, eleghị anya ka a hapu ịji ya wee chọpụta otu ihe siri me. N’akụkụ nke ya, Emmanuel Eze, onye nlekọta ụlọ oriri na ọnụnụ ahụ kwuru na ya mere njem mgbe ya bụ ihe dapụtara ma kwuo na ọ kpọtụụrụ ndị uweojii ozugbo ya chọputara ihe merenụ.