ỌCHỊCHỊ steeti Anambra amalitela ịlụ ụlọ ezumeezu mba ụwa, bụ nke ga na-erite mmadụ ruru puku iri ise n’ọnụ ọgụgụ na steeti ahụ, ma kwuo na a ga-arụchapụ ya n’afọ na-abịa abịa.
Aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ mere ka a mara nke a n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ oge ọ gara gbapee ya bụ ọlụ, bụ nke o kwùrù na a gà-anọ na mpaghara ebe ọbụla n’Awka wee na-ahụ gbamgbam ya ma ọ bụrụ na a rụchaa ya.
Gọvanọ Obianọ, dịka ọ na-agbape ọlụ ahụ, mèrè ka a mara na ya bụ ụlọ ga-enwe òkpùkpù iri, nwee gbamgbam ogo ya ga-eru mità iri na asatọ, ma nwekwa ebe a na-atụ ndụ mmanụ nakwa ọtụtụ ime ụlọ ọgbakọ ezumeezu n’ime ya, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
Ọ kọwara nke ahụ dịka ótù n’ime nnukwu ọrụ dị iche iche ọchịchị ya bàgìdègòrò na ya nso nso a, gosìputa ezi olile anya o nwere na onye ji ya bụ ọrụ ngo ga-arụchapụ ya n’oge a tụrụ anya, ma keleziekwa ụlọ nzùkọ omebe iwu steeti ahụ maka ịnabata na ịkwàdò amụmà ego ọrụ nke afọ 2019 o zìtèère ha na-egbughị oge, bụ nke o kwuru na ọ ga-enyekwa aka n’ụzọ pụrụ iche ime ka ya bụ ọrụ gaa siriri werere.
N’okwu nke ya, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka iwunye ụlọ, bụ Maazị Emeka Ezenwanne kọwara na a rụchaa ya, na ya bụ ụlọ ezumeezu ga-enye aka n’ịkwàlite ọnụ ego a na-enweta n’ime steeti ahụ. O mere ka a mara na ya bụ ụlọ ga-abụ ụdị ya nke mbụ a na-arụ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị niile, ma kwuo na n’ezie na ebe ahụ ga-abụkwa ebe ndị mmadụ ga na-abịa njem nlegharị anya ma ọ bụrụ na a rụchaa ya.
Na mbụ n’okwu ya, onyeisi ụlọ ọrụ ji ya bụ ọrụ ngo, bụ Maazị Mark Tu kọwara ya bụ ọrụ dịka nke ga-adị ọkpụtọrọkpụ, kwuo na a ga-ewu ya ka ọ nọrọ n’ogoogo mba ụwa, ma kwekwazie nkwà na ha ga-arụchàpụ ya bụ ọrụ n’oge a tụrụ anya ya.
Dịka ọ na-akọwa ọrụ ngo ahụ dịka nke magburu onwe ya nakwa nke ga-adọta mmepe tọrọ àtọ na steeti ahụ, onyeisi ụlọ ọrụ ‘Awka Capital Development Authority’, bụ Maazị Amaechi Okwuosaị tòrò Gọvanọ Obianọ maka ịbàgìde na ya bụ ọrụ, bụ nke o kwuru na o nwere ọtụtụ uru na mmepe dị iche iche ọ ga-ewetara Awka bụ isi obodo steeti ahụ nakwa izugbe steeti ahụ n’ozuzu oke, ma kpọkuo ya ka o jide ka o ji.