
EMUME Ekeresimesi bụ emume a na-eme afọ ọbụla nke e ji echeta ọmụmụ onye nzọpụta. Ọ bụ ma ọnwa Disemba dị n’abalị iri abụọ na ise ka a na-eme ya. Ọ bụ emume na-ewe otu izuụka zuru ezu n’ihi ihe ndị ọzọ a na-agbakwunye na ya dịka nzukọ, ịgba nkwụ, ịgba akwụkwọ, idu obi/ụlọ, imepe ụlọ, w.d.g.
Ọ bụ n’ihi nke a ka ọnwa Disemba ji bụrụ ọnwa mmemme tinyekwara ọnwa e ji eri ego. Maka nke a, ahịa na-ekwo ekwo ebe ndị mmadụ na-agbakeri ala azụkọ ihe ha ji agba ya bụ Ekeresimesi. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ejikwa ohere ahụ ala ụlọ.
Ị gaa n’ahịa na nso nso a, ndị na-ere ere na-ebe ndị na-ego ego na-ebe. Isiokwu wee bụrụ na isi akwa adịghịkwa ebe a fanyere ya.
Ndị mmadụ na-eti mkpu n’ihe siri ike nke ukwuu. Ọnụ ahịa rịrị arị karịa ka ọ dị na mbụ.
Mana emere elu, emere ala, a ga na-azụ ahịa, ọkachasi oge ugbua n’ihi na e tere ụgba, e tere ogiri, a ga-agbarịrị Ekeresimesi.
Nwokorobịa aha ya bụ Chidi, nọ n’ahịa Eke Awka ere akwa obube kwuru na ha anaghị ere ahịa otu o kwesịrị. Ọ kọwara na ihe kpatara nke a bụ n’ihi ihe isi ike nke ji ala Nigeria isi aja aja. Ọ gara n’ihu kọwaa na ọ bụghị otu ahụ ka ọ na-adị n’oge mbụ.
N’akụkụ nke ya, Ebuka na-ere ihe e ji achọ mma kwuru na ya na-ere ahịa ya nkeọma. Ọ sịrị na ụmụnwanyị ejighị ịchọ mma egwu egwu, n’ihi nke a ,ahịa ya na-aga were were.
Otu nwanyị achọghị ka a kpọọ aha ya ma bụrụ onye na-ere osikapa kwuru na-ahịa anaghị aga aga. Nwanyị a kwuru na afọ gara karịa nke mba ofesi mana isiokwu ya bụ na ahịa anaghị aga otu o kwesịrị n’ihi ihe isi ike.
aga ka afọ nke a mma. Site n’ajụjụ a jụrụ ya, ọ kọwara na ndị mmadụ ka azụrụ osikapa ala anyị karịa nke mba ofesi mana isiokwu ya bụ na ahịa anaghị aga otu o kwesịrị n’ihi ihe isi ike.
Otu nwoke na-ere ihe e ji edina ala (foam) kwuru na ọdịghị onye na-ajụ ha ma ha kpọbara akpọba ma ha a na-ere ere. N’agbanyeghị na ahịa ahụ bụ nke ndị mmadụ kwesịrị ị na-achụ otu nwamba si achụ oke ugbua mana onweghị nke na-eme.
Ọtụtụ ndị mmadụ kwuru na ihe oriri ka mkpa ugbua karịa ihe ndịna na akwa n’ihi na onye ọbụla nwere ike dinara n’ala moobu yiri akwa ochie ya.
Eze Ike, bụ onye na-ere ayịya kwuru na ha ka na-ele anya ndị mmadụ n’ihi na ahịa ha abụghị ahịa a na-egote edebe edebe. O kwuru na ndị mmadụ na-egokari ya ma
Ekeresimesi fọdụ izu ole na ole.
Ụfọdụ ndị mmadụ kwuru na ụmụaka ha ga-eji akwa ochie ha wee gbaa ekeresimesi ebe ụfọdụ kwuru na ha ga-aga gota ọkịrịka. Ndị na-ere akwa ụmụaka na-ere nwayọọ nwayọọ. Ọ naghị ekwo ekwo n’ihi njọ ụbọchị. Otu ahụ ka ọ dịkwa n’ebe ndị akpụkpụụkwụ nọ makana ihe na-ebe be oke na-ebe be ogịnị.
Otu o sina dị, ndị ụwa mgbede bụ ndị na-egbuka ọkịrịka na-azụ n’ike n’ike. Ahịa ha na-ekwo ekwo nke bụ na Ka Ọ Dị Taa enweghị ike ịgba ha ajụjụ ọnụ. Ma ndị na-ere ere, ma ndị na-azụ azụ, ahụghị ụzọ. Ndị a na-egbu ọkịrịka na ntụ nke bụ ụdị ogbenye ọ sọrọ gị bụrụ, irute n’ọdụ ahịa ha, ị ga-ekpo akwa wee laa be gị. A na-akpọ ha ụwa mgbede n’ihi na ọ bụ mgbede ka ha jị apụta.