NdỊ uwe ojii na mpaghara Lekki na steeti Lagos anwụchikọọla ụmụ okorobịa abụọ gburu nwa gbàrà afọ iri ma bèré ya isi maka ịgwọ ọgwụ ego.
Nke a bụ nke e mere ka a mara site n’ọnụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Chike Oti n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, bụ nke ọ nọrọ na ya wee kwuo na ndị ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ site n’aka ngalaba nchekwa na-ahụ maka ibu agha megide ntọrị mmadụ na mpaghara ụzọ awara awara Ajah/Epe.
Ndị ntorobịa abụọ ahụ bụ ndị ọ kọwara dịka Ayodeji Obadimeji gbara afọ iri na asatọ na Saheed Obadimeji gbara afọ iri na iteghete ma bụrụ ndị o kwuru na ha bì na akụkụ Tunde Balogun Street, Shapati, Ibeju-Lekki.
N’ajụjụ ọnụ a gbara ụmụnne abụọ a rụrụ ya bụ àlà, ha kwuru na Sodiq Abefe gwara ha ka ha wetara ya isi mmadụ n’ọnụ ego dị narị puku Naịra abụọ; ha wee dunye otu nwata ka ọ ga zụtara ha mmanya coke, bụzị nke, mgbe o wètara ha, ha wee jide ya, gbuo ya ma bèré isi ya.
Obere nwata nwoke ahụ e gburu bụ onye nne na nna ya kwuru na aha ya bụ Joseph Makinde gbara afọ iri.
Maazị Oti gara n’ihu kwuo na ndị ọlụ ya ebutela ogwodo ahụ nwata ahụ ebe a tọgbọrọ ya n’ụlọ arụchabeghị arụcha dị na Shapati, ma sịkwa na ha na-eme nnyocha pụrụ iche iji nwụchikọọ ya bụ Sodiq Abefe tere ofe nwaebule jiri rachakwee eze, site n’idunye ụmụaka ahụ n’ime ụdị ihe ọjọọ ahụ.
O kwuru na kọmishọna ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Edgal Imohimi, enyela iwu ka e nyefee ndị ahụ n’aka ndị ngalaba na-ahụ maka igbu ọchụ n’ụlọ ọlụ ‘Criminal Investigation and Intelligence Department’ (SCIID), ka ha wee mekwuo nnyocha miri èmi.