ONYE nnọchị anya mbà South Africa na Nigeria, bụ Maazị Bobby Moroe abrịọla steeti Anambra, ka ya na mba ha jikọọ aka ọnụ na-emekọ akụnụba.
Ya bụ nwoke bụ onye anabatara n’ebe obibi gọvanọ dị n’Amawbịa site n’aka Gọvanọ Willie Obianọ na ụfọdụ ndị isi ọchịchị steeti ahụ.
N’okwu ya na nzuko ọ bịara n’Anambra, Maazị Moroe sị na o meela nnyocha wee chọpụta na ndị ntorobịa steeti ahụ bụ ndị na-agbasi mbọ ike, ma sị na ọ bụ ya mere o jiri sị ka ọ bịa kpọtụrụ steeti ahụ n’ihi na ha nwere mmasị n’iwulite ndị mmadụ na ịkwàlite njem nlegharị anya, ọlụ ugbo, ụlọ oriri na ọñụñụ na ụlọ mmepụta ngwọ ahịa.
O kwuru na ọ chọpụtara na steeti ahụ nwere ihe onwunwe na ndị nwere ọgụgụ isi, ma sị na ọ bụ ya mere o jiri chọọ mmekọrịta ya na steeti ahụ, iji wee kwàlite ohere ọma na ohere ọhụrụ maka ndị ntorobịa steeti ahụ.
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ mgbe ha mechara nzùkọ ahụ, aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ mere ka a mara na steeti ahụ nwere ohere ọma ma gbasapụ aka ya maka njikọ aka ha na ndị mmadụ na ụlọ ọlụ dị iche iche, bụ nke ga-eweta ma kwàlite ezi ọdịmma nke ụmụafọ steeti ahụ.
O kwupụtara ụfọdụ ihe dị iche iche ha kpàrà na ya bụ nzùte ọ bịara, nke otu n’ime ha bụ ịchọ ka ọ ga-esi kwe omume ka e gùzobe ụlọ ọrụ ndị mba South Africa na steeti ahụ, tinyere ụfọdọ ihe ndị ọzọ.
Ndị ọzọ sonyere n’ọgbakọ ahụ gụnyere ode akwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwuobelụ, onyeisi ndị ọlụ nye gọvanọ, bụ Maazị Primus Ọdịlị, tinyere ndị ọzọ.