GỌỌMENTI Steeti Anambra ekwuola na ọ ga-etinye ego dị ijèri Naịra iri n’ọrụ okporo ụzọ dị iche iche na steeti ahụ, iji hụ na a rụchapụrụ ha tupuu oge udu mmiri eruo. Gọvanọ Willie Obianọ kwuputara nke a oge ọ gara ịmara ka ọrụ si aga n’ebe dị iche iche e ji ọrụ okporo ụzọ n’okpuru ọchịchị Awka South na Nnewi North nke steeti ahụ, bụ nke ọ nọrọ na ya mee ka a mara ndị ji ọrụ ngo dị iche iche na steeti ahụ ruru iri ise na abụọ n’ọnụ ọgụgụ.
O kwuru na a ga-etinye ọkụ okporo ụzọ n’ụzọ ndị ahụ ma a rụchaa ha, ma kpọkuokwa ụmụafọ steeti ahụ ka ha kwàdo ma tụnyere ndị ji aha otu ndọrọ ndọrọ APGA apụta ịzọ ọkwa dị iche iche na steeti ahụ akwụkwọ na nhọpụta izugbe ahụ na-abịa n’ihu n’ala anyị iji hụ na ya bụ ọrụ ọma ọ na-arụgasị gara n’ihu.
N’okwu nke ya, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọrụ, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọr mere ka a mara na gọọmenti steeti ahụ enyela ọrụ ngo ịrụ ọrụ okporo ụzọ Esther Obiakọr dị n’Awka, ma kwuo na ọrụ ga-amàlite ebe ahụ oge adịghị anya.
O kwukwara na e teela ihe ruru kilomita abụọ n’ime kilomita anọ na ụma iri na iteghete nke okporo ụzọ mahadum “Unizik College of Health Sciences” dị na Nnewi n’okpuru ọchịchị Nnewi South, ma sịkwa na ya bụ ụzọ ga-eme ka ihe dịrị ụmụakwụkwọ na ndị ọzọ bi na mpaghara ebe ahụ mfé ma a rụchaa ya. O kwukwara na ebumnobi gọọmenti steeti ahụ bụ ịrụchapụ ọrụ okporo ụzọ dị iche iche e ji n’aka na steeti ahụ tupuu udu mmiri abịaruo nsó.
Na ntụnye ya, onyeisi otu jikọtara ụmụakwụkwọ na mahadum ahụ, bụ Maazị Joseph Okafọr tòrò Gọvanọ Obianọ maka ịgbatara ha ọsọ enyemaka na ya bụ ụzọ dị njọ kemgbe, ma kwe nkwà na ụmụakwụkwọ ahụ ga na-enye ya nkwàdo zuru òkè iji hụ na ya bụ ọrụ ọma o ji n’aka gara n’ihu.
Ụzọ ndị ahụ gọvanọ gara ịmara ka ọrụ si aga na ha gụnyere okporo ụzọ “Unizik College of Health Sciences”, bụ nke e nyere ọrụ ngo ya n’ahọ 2015; nke siri mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Awka gaa Amansea, bụ nke dị kilomita atọ na ụma ise, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.