Ọ KPỌTỤRỤ akpọtu n’obi Igwe Felix Ebelendu, Nnanyelugo n’Agulezechukwu nke dị n’ Aguata, dika e kpunyere ụmụnwoke iri anọ na abụọ okpu dịka ndị ichie n’obodo ahụ.
Igwe Nnanyereugo n’Agulezechukwu n’okwu ya kọwara na ọ bụ n’afọ 1976 ka e chiri ya Igwe Agulezechukwu. O mechaara họpụta ndị ichie ya na ha na-alụ ọlụ, mana ka ihe siri diri imirikiti n’ime ha alaana mmụọ nke mere na a na- ahọpụta ndị ọzọ ka ọlụ obodo wee na-aga.
Ọ kọwara na ebumnobi e ji echi ichie bụ ka ụmụnna ọbụna nwee ike mara ihe na-eme n’obodo ka o wee na-aga n’ihu. ọ gakwara n’ihu kọwaa sị. “Ihe a tụrụ anya n’aka ndị ichie bụ ikwu eziokwu, onye hụ ihe dị ọcha o kwuo na ọ di ocha, onye hụkwanu nke dị oji o kwuo na ọ dị oji”
Igwe Nnanyerugo kwukwara na udo ga-ebido n’ezinaulo ha, ruo ụmụnna wee pụta n’obodo. Ọ gọọrọ Agulezechukwu ọfọ ihe ọma ma kpekwaa ka e nwee ezi nhọpụta ọchichi n’ala Nigeria dika e si mee na steeti Anambra.
Otu nwanyị onye Agulezechukwu aha ya bụ Oriaku Agatha Obiageri Chukwuma kọwara na ọ bụ Omenala Agụlụezechukwu ka a na-egosiputa. O kwuru na ọtụtụ ndị ichie anwụọla nke mere e ji e chi ndị ọhụrụ ka ha na- enyere Igwe aka. Ọ gakwara n’ihu kwuo na ihe a na-elegara anya wee na-ahọpụta ndi ichie gụnyere ime ezi omume na ikwu eziokwu.
Lolo Ngozi Godwin Ezeuko, onye nke di ya so na ndị ichie ọhụrụ gosipụtara añụrị ya na mmemme ahu site n’ikele Chineke. Ọ gbaara di ya ama dịka onye na-ekwu eziokwu na onye na-enyere mmadụ ibe ya aka. Onye na-abụ ọ kwụrụ ọ kwụdosie ike.
N’aka nke ya, Ezinne Grace Okoye, nwunye Martin Okoye bụkwa otu onye n’ime ndi ichie ọhụrụ kwuru na echichi ndị ichie ahụ ga-eweta udo na ịhụnanya.
N’akụkụ nke ya, Igwe Ikenga bụ Igwe Alfred Ezeobi Onwuneme kọwara emume ahu dika nke dị mma ma bụrụkwa ihe inye Chineke ekene. O kwuru na ọ bịara ịnọnyere Igwe Agulezechukwu na ya bụ oke mmemme.
Bridget ọkpala, tinyekwara ọtụtụ ụmụnwanyi ndị e chiri di ha ichie ji otu olu kwuo na ịga n’ihu di mma makana obodo na-eto eto. Echichi dị otu a ga-enye aka ikwado ndị mmadụ n’ogo dị iche iche.
Otu onye n’ime ndị ichie ohụrụ ahụ bụ Ichie Godwin Ezeuko kelere Chineke onye mere ka o soro n’otu n’ime ndi obodo họpụtara maka ibụ ichie, ọ kọwara na ọ bụ ndi nyeere obodo aka n’ụzọ dị ichie iche ka a na-ahọputa maka ya bu okwa.
Oyinatumba Agulezechukwu gọkwaara ala anyị bụ Nigeria ọfọ ihe ọma maka afọ ahụrụ a banyere. Ọ rịọrọ Chineke ka o wepuru anyi agụụ, ka onye ọbula nwee ike lekota ezinaụlọ ya anya.