IRU mgbede bụ otu n’ime emume ma ọbụ mmemme ndi Igbo na-emere ụmụ ha ndi nwanyi mgbe ha tozuru ihe eji nwanyi eme ma o bụ oge nwata nwagboghobia ruru ogo ilu di. Ndi nne na nna n’ala Igbo na-emere emume a bụ ụmụagbogho togolo ogo ilụ di nke na-amaghi nwoke.
N’oge mbụ, a na eme emume iru mgbede na obodo di iche iche na-ala Igbo dika Mgbidi, Ngwa, Bende, Isuikwuato, Arochukwu, Orumba, Onitsha, Awka, Nnewi, Umuahia wee diri gabazia.
Obodo di iche iche ndia na eme emume a dika onọdụ obodo ha si di. Obodo ufọdụ na-akwado mmemme a otu onwa, ufodụ onwa abụọ ma obụ ato di ka ha si chụọ. Iji amatụ, na Mgbid,i iru mgbede na-ewe naani otu ọnwa. Ka o sina di, emume a adighi aputakwa ihe dika otu ọ dị na mbụ na ndụ ndi Igbo ugbua.
O bụ n’ihi na ndi Igbo na-echere nwa ha ezi echiche ka a na-eji emere ụmụ nwanyi iru mgbede. Ha na akwusi nwata nwagboghọ ije ozi ma duba kwa ha n’ụlọ mgbede ka ha nọrọ ebe ahụ buo ibu, maa abụba, ma na-etụkwa akpiri. Nke ga eme ka ụmụ Okorobia bia lụọ ha ngwa ngwa. Obi anaghi adi nwagbogha ọ bụla emereghi irụ mgbede nma. Nwagbọgha emereghi ya iru mgbede, ndi ibe ya na- eji ya akọ ya ọnụ. N’ihi nke a, ọbụrụ na nwoke alụọ nwanyi mgbe o dị na nwata, o too, di ya ahụ aghaghi imere ya ir mgbede. Ọzokwa, ọ bụrụ na emereghi nwagbọghọ irụ mgbede, ha na eche na ikekwe, ihe agaghi adiri ya mma na be di ya, ma ọ bụ na ogaghi amụta ezigbọ nwa.
A na-ebido n’udu mmiri zụba ji na ede, akpụ na ọkụkụ. Ikwu na ibe na agbata inye aka wee hụ na ihere emeghi nwa ha na-erụ mgbede.
Mgbe nwagbogho no n’iru mgbede, ọ naghi apụta ezi n’ebe mmadu ga-ahụ ya anya. O ga- enwe nwatakiri nwanyi ga na- ejere ya ọzi.
Oge ụmụagbọghọ ndi a ga-apụta ịzụ ahia, a ga-agwa ụmụokorobia ka ha buru nkwa bịa ahia itiri ha egwụ n’ahia. Ndi ụmụagbọghọ ndia ga-azụ akwa di iche iche mefụkwaa egọ nke ụkwụ ka ihere ghara ime ha n’iru ndi mmadụ. N’ ụbọchi ahia obodo, mgbe ahia juru, ndi nkwa ga-ebụtụ nkwa ha na-akụ obodo gbụrụgbụrụ iji gwa ụmụ nwanyi ndia ka ha jikere ije ahia. Mgbe oge ruru, ụmụagbọghọ ndia ga esọ ndi nkwa ụmụọkorọbia site na otu isi ahia were na aga ahia ahụ gbugburu, tupu ha anọdụ ala otu ebe na-agba egwụ.
Ndi nne na nna, ikwu na ibe, enyi na ndi nwere nmasi na -enye ndi ruru mgbede ego. Ụfọdụ na- enye akwa, ewụ, ọkụkọ na ihe onyinye di iche iche ka osi metụta onye.
Ihe eji emere nwagbogho ememe iru mgbede
- Nne na nna ji oge a egosipụta ihunanya ha nwere ebe ada ha nwanyi nọ. Ọ bụ oge ha ji akwụ ya ụgwọ ọrụ niile ọ rụrr ha n’ezi na ụlọ. Ha jikwa oge a egosi obi ụtọ ha nwere na o biri ndu oma dika nwagbogho.
- Ọ bụ oge nne na nna ji agwa ohaneze na ada ha eruola ilụ di. Mgbe e ruchara mgbede, ụmụagbọghọ ndi nwegoro di na-ala be di ha. ọ bụkwa ohere ndi enwebeghi di ji enweta.
- A na esitekwa n’iru mgbede zụọ ma kwadobe nwagbogho maka ndụ ezi na ụlọ. Nke a na enyere ya aka nke ụkwụ n’oge ọ lara be di ya.
- Iru mgbede na-enyere nwagbogho aka ichapụ achapụ. ọ bụ oge e jị elekota nwagbogho anya na ụdi pụrụ iche nke na- eme ka ahụ ya na ama pokopoko. ọ bụrụ onye alubeghi di, mgbe o ruchara mgbede pụta, di na-abiara ya osọọsọ n’ihi oke mma ọ na-amazi oge ahụ.