AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ etòóla ndị ọrụ agha ala Nigeria lagoro mmụọ ma jakwa ndị dị ndụ ike n’ihi mbọ pụtara ihe ha gbàgòrò na nkè ha ka na-agba ichekwaba ala anyị na ùgwù dịịrị ya.
Gọvanọ Obianọ mere nke a na mmemme a chịkọbara iji merùbe ncheta ụbọchị ndị ọrụ agha ala anyị, bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka. Ọ kọwara ya bụ mmemme dịka nke magburu onwe ya na ụzọ pụtakarịchara ìhè e sì akwanyere ndị ọrụ agba ala anyị ùgwù, ma ndị dị ndụ ma ndị nwụrụ anwụ. O tòkwazịrị ndị ọrụ agha ala anyị maka àjà ha na-achụ ichekwaba ya bụ àlà, ma dụọ ha ka ha jide la ha jì.
A nọrọ na mmemme egbe buru ọlaa ahụ, bụ nke e jiri wèta na njedobe, mmemme dị iche iche e mere n’ahọ a n’imerùbe ya bụ oke ụbọchị, mee ịkwụ n’ahịrị, ma debe ihe ndebe okooko a kpara akpa (wreath) n’elu ihe e jiri mere ílì ụfọdụ ndị agha ala anyị lagoro mmụọ, bụ nke e mere site n’aka Gọvanọ Obianọ, ndị isi ọrụ agha na ndị ọzọ e ji okwu ha àgba ìzù.
A nọkwàrà na ya bụ oke mmemme bụọ ọtụtụ abụ, mee nkenke oriri na ọñụñụ akwamozu, ma hapụkwa ọtụtụ ndùrù ka ha felaa elu site n’aka Gọvanọ Obianọ, bụ onye kọwara ya dịka ihe na-egosìpụta udo.
Nchèta ụbọchị ndị agha bụ nke a na-emebụ n’ụbọchị iri na otu nke ọnwa Nọvemba n’oge mbụ iji chèta mbọ pụtara ihe ndị ọrụ agha gbàrà iji wèta ọgụ mba ụwa nke mbụ na nke abụọ n’isi njedobe; ma e mechaa gbanwèé ya ka ọ bụrụzie nke a ga na-eme n’ụbọchị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị ahọ ọbụla iji merùbe ncheta mbọ ndị ọrụ agha ala anyị gbàrà iji gbochie nkèwa ala Nigeria n’oge agha Nigeria na Biafra.
Ndị dị iche iche sonyere na ya bụ mmemme gụnyere: okwuputa okwu ụlọ ọgbakọ omebe iwu Steeti Anambra, bụ Oriakụ Rita Madụagwụ, ọkaikpe steeti ahụ, bụ Ọkaiwu Peter Umeadị, ndị selitere isi n’ọrụ agha nakwa ọtụtụ ndị ọzọ dị iche e ji okwu ha agba ìzù na ya bụ steeti.