DỊKA a sị na a gbaghị ìrùrò e kwòrò èkwò n’anwụ, ọ naghị akpọnwụ ngwa-ngwa, ndị ọrụ uwe ojii na steeti Anambra anwụchikọọla ma kpụgharịa ụfọdụ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ohi. Ndị ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ n’ime ọnwa a site n’ebe dị iche iche na steeti ahụ, maka ọtụtụ arụrụ ala n’akụmakụ dị iche iche.
Kọmishọna ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ Maazị Garba Ụmar mere ka a mara nke a n’okwu ya bànyere nke ahụ, ma sị na ọnụ ọgụgụ ndị ahụ gbàkọtara wee dị iri na abụọ. Ọ sị na n’abalị iri na abụọ nke ọnwa Jenụwarị a, na ndị ọrụ nchekwa ‘Special Anti Robbery Squad’ (SARS) nwụchikọrọ Maazị Chimezie Arọnụ, Obiọra na Chibụike Ọmankwụ n’ime obodo Ire dị n’Ogidi n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti ahụ maka ohi ha zùrù na mgbagbu ha gbàgburu Maazị Ifeanyịchukwu Nwanga sitere Ifitedunu, tinyere ọgwụ a gwọrọ agwọ, egbe, mgbọ egbe na ihe ndị ọzọ e nwetasịrị n’aka ha.
Ọ sị na a nwụchikọkwara Maazị Ebuka Emekwite na Uchendụ Afụnwa n’abalị iri na atọ nke otu ọnwa a maka ohi ha zùrù Maazị Linus Emeka, bụ onye ha napụrụ ụgbọala ya n’ike, tinyere nsụnsụ egbè na ihe ndị ọzọ e nwetàrà n’aka ha; ebe e jidekwara Abụchukwu Obiekwe na Michael Okoye n’abalị iri na asatọ nke ọnwa a, maka iji mgbọ egbe merụọ Maazị Michael Victor ahụ, dịka ha na-achọ ịnapụ ya ọgbaa tum tum ya n’okporo ụzọ ahụ siri Agụlụ gaa Adazi-Nnukwu, tinyere egbe na ihe ndị ọzọ e nwetakwara n’aka ha.
Dịka a ga-asị na nke ahụ ezubeghị, Maazị Ụmar gaara n’ihu mee ka a mara na n’abàlị iri abụọ nke otu ọnwa Jenụwarị a, na ndị òtù ọrụ nchekwa ahụ bụ SARS nwụchikọkwara mmadụ anọ, bụ Maazị Emeka Iheanachọ, gbara ahọ iri abụọ na ise, Nwobodo Kosichukwu, gbara ahọ iri abụọ na isii, Rapụrụchukwu Ọbụm, gbara ahọ iri abụọ na asatọ, tinyere Ekene Edeh, gbarakwara ahọ iri abụọ na asatọ, maka ohi ha zùrù Maazị Mbazue Chizọba, sitere Nsugbè, bụ onye ha napụrụ ụgbọala ‘ọkwụ ọtụ ekele eze’ (Jeep) ya.
Dịka a na-akpụgharị ndị ahụ, Kọmishọna Ụmar kwuru na ya na ndị òtù ọrụ ya na-agbasi mbọ ike esepughị aka, iji hụ na e memìlàrà mpụ, ohi na arụrụ ala na steeti ahụ, site n’ọtụtụ usoro na atụmatụ dị iche iche, ma sị na ya bụ ịgba mbọ na-amịta nkpụrụ nke ọma dịka a tụrụ anya ya.
Ọ kpọkuzịkwara ndị ohi na ndị ọzọ na-etinye aka n’arụrụ ala ndị ọzọ dị iche iche ka ha sepu aka ha ngwa-ngwa tupuu aka akpàra ezeku udele; ma dụkwazie ụmụafọ steeti Anambra ka ha na-agbara ha bụ ndị ọrụ nchekwa àmà ma na-akpọkùkwa ha site n’akàrà ekwentị 07039194332 oge ọbụla e nwere ọnọdụ ntụmadụ ma ọ bụ ọnọdụ dị àñaa, iji wee gbatara ha ọsọ ènyèmaka aka ọkụ aka ọkụ.