E mepeela ebe nlekọta ahụike abụọ n’Idemili

0
1034

OKE ọñụ dara nnọọ n’Ogidi na n’Eziowele dị n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra dịka a gbàpere ebe nlekọta ahụike, bụ nke e dozighàrịrị site n’aka otu nnọrọ onwe a kpọrọ ‘The Challenge Initiative’ (TCI).

Ụlọ ahụike abụọ ahụ bụ nke a maara dịka ‘Maternal and Child Health Clinic, Ogidi’, na ‘Eziowele Primary Health Care Centre’, ma bụrụkwa nke guzoro ugbu a site na njikọ aka gọọmenti steeti ahụ na òtù nnọrọ onwe.

N’okwu ya dịka ọ na-agbape ha bụ ụlọ ahụike, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ahụike, bụ Dọkịta Josephat Akabụike tòrò ya bụ ụlọ ọrụ nnọrọ nwe, bụ nke o mere ka a mara na o teelarị ha jiri kpaba ike na mpaghara mgbago ugwu ala Nigeria, wee ruo mgbe ha  bàtàrà na steeti ahụ wee bido ịgbata ọsọ enyemaka, dịka ụlọ ọrụ na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ mèchara ka ha mara maka atụmatụ dị iche iche ha ji n’aka na ngalaba ahụ, bụkwa nke ụlọ ọrụ ahụ nabàtara.

Ọ kpọpụtasịrị ihe gọọmenti nọ ugbu a na steeti ahụ mepụtagoro na ngalaba dị iche iche na steeti ahụ, site n’onwe ya na site na njikọ aka ọnụ nke òtu dị iche iche, ma mee ka a mara na ya bụ ọchịchị ga-aga n’ihu na njikọ aka ahụ, iji hụ na ngàlàbà niile ahụ, ọ kachasị ngalaba ahụike, ga-anọ n’ogoogo dị oke elu, ma bụrụkwa nke a na-eñòmi èñòmí.

N’okwu nke ya, otu onye selitere isi na ngalaba ahụike n’Ogidi, bụ Maazị Ike Nwosisi kèlèrè gọọmenti steeti ahụ na òtù ‘The Challenge Initiative’ (TCI), ma kwuputakwa obi ụtọ ha bànyere ya bụ ọrụ ọma, ọ bụnadị dịka o kwèrè nkwà na ha ga-elekọta ihe ndị ahụ anya nke ọma na otu o kwèsiri.

Ndị otu ‘The Challenge Initiative’ bụ ndị e mèkwàrà ka a mara na ha edozigharịala ụlọ ahụike anọ na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ, n’okpurù atụmatụ “seventy two hours makeover”.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here