Gaanụ n’ihu na-ịkwàdo APGA – Obiano arịọ ndị Anambra

0
548

A  KPỌKUOLA Ndị Anambra na ụmụafọ Igbo niile ka ha gaa n’ihu ịkwàdò otu ndọrọ ndọrọ ‘All Progressive Grand Alliance’ (APGA) iji hụ na ya bụ otu ndọrọ-ndọrọ nwètara nturu ùgò dara ụda na nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme n’ala Nigeria nso nso a.

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ mere ka a mara nke a na njem ị sị ‘Daalụ nụ’, bụ nke ọ bàgidere n’Ụmụnze, dị n’okpuru ọchịchị Orumba South, bụ ebe o sikwàrà wee gaa Ajalị, bụ isi òbòdo okpuru ọchịchị Orumba North.

Ọ kọwara otu ndọrọ ndọrọ APGA dịka nke e ji ịdị n’otu mara, dịka otu ezinaụlọ, kwuo na ọ bụ n’ihi ya ka o ji agawanye n’ihu n’itó eto na n’inweta mmeri dara ụda, ma kpọkuokwa ndị òtù ndọrọ-dọrọ ahụ ka ha gbasò ma jigidekwa ịdị n’otu ahụ, iji hụ na ndị niile ji aha òtù ahụ azọ ọkwa dị iche iche nwètara mmeri dara ụdà.

O chetaara ndị okpuru ọchịchị Orumba otu ha siri nọrọ n’enweghị ọkụ ọtụtụ ahọ, wee ruo mgbe ọchịchị ya gbàtara ọsọ enyemaka, bụzị nke mere ka a na-enwe ọkụ gbànyụụ na mpaghara ahụ ugbu a. Ọ kpọpụtasịrị ihe dị iche iche ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ mepụtagoro na mpaghara ahụ na ọrụ ngo ndị ọ rụgooro ha, ma rịọ ha ka ha gaa n’ihu inye otu ndọrọ-ndọrọ ahụ nkwàdó oge ọbụla, ọ kachasị na nhọpụta ahụ na-akpụdòbe nsó.

N’okwu ha n’otu n’otu na njem abụọ ahụ onyeisi oche nchere ogè n’okpuru ọchịchị Orumba South, bụ Maazị Raymond Onyegụ, na ògbò ya nke Orumba North, bụ Oriakụ Ify Obinabọ, kọwara Gọvanọ Obianọ dịka nwoke na-enwe mmetụta bànyere ọnọdụ ụmụ mmadụ, bụ nke o gosipụtagoro na ngalaba niile nke steeti ahụ, ma kwe ya nkwà na ndị Orumba ga-atụnyere APGA n’ihi na ndị dị iche iche a họpụtara iji aha ya bụ otu ndọrọ-ndọrọ wee zọọ ọkwa bụ ndị tozùrù òkè ma maarakwa nke ekwe na-akụ.

GUO:  COVID-19: Gọọmenti ga-enyeghàchi ndị mmadụ pasentị iri n'imeu ụtụ Isi ha kwụrụ na 2019 —Obianọ

Ndị ọzọ dị iche iche sonyere na ya bụ mmemme gụnyèrè: nwa amadi ahụ jibụrụ ọkwa onyeisi ụlọ ọba ego ala anyị n’oge gara aga, bụ Maazị Charles Soludo; Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka gburugburu, bụ Maazị Mike Okonkwọ, ògbò ya nke na-ahụ maka ọrụ, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọr; onyeisi ụlọ ọrụ ‘Anambra Advertisement and Signage Agency’, bụ Maazị Jude Emecheta, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here