A BIA n’ala Igbo, ịwa akwa bụ mmemme a na-emere nwoke tozugoro ogo ịlụ nwaanyị. Ịwa akwa bụ nkwado a na-akwado nwoke ọ bụla rugoro afọ iri abụo na iteghete ma ọ bụ afọ iri atọ nke nne na nna ya na-akwadoro ya.
Nwoke ahụ ga-anọ n’ụlọ ha ihe dịka ọnwa atọ, ọ gaghị apụta apụta. Ndị be ha ga-agba nnukwu mbọ ịhụ na a na-enye ya ihe ọ ga na- eri wee rue ụbọchị ahụ ọ ga- alụ nwaanyị.
N’ime ọnwa atọ ahụ, a ga- akuzikwara ya ọtụtụ aka ọlụ dị iche iche dịka otu esi akpa ute, ite nkwụ, igbu akwụ nakwa ihe ndị ọzọ ọ ga-eji na-enyere ndụ aka ma ọ lụọ nwaanyị ka agụụ hapụ ịnara ya ụmụaka ya.
Oge ụfọdụ, nwoke na-awa akwa ma ọ bụ mgbe ọ wachara akwa, ndị mmadụ na-enye ya onyinye dị iche iche dịka ego, akwa, ihe oriri na ihe ndị ọzọ dị iche iche.
N’oge mbụ,
Obodo dị iche iche na-eme emume iwa akwa dịka ọnọdụ obodo ha si wee dị. O nwere ụfọdụ obodo na-akwado mmemme ịwa akwa n’otu ọnwa, ụfọdụ jikwa ọnwa abụọ ma ọ bụ atọ akwadobe ya.
Obodo ụfọdụ na-eme emume iwa akwa ha n’afọ atọ ọbụla. A bịa n’ Ehime dị na Mbano, ha na-eme emume iwa akwa.Obodo ndị ọzọ dị n’ Imo Steeti na-emekwa ya dịka Obowo, Mbaise na Mbano.
Ọ dị nnukwu mkpa na nwokorobịa ọbụla ga-awa akwa tupu ọ lụọ nwaanyị
Uru ọ bara na nwoke wara akwa tupu ọ lụọ nwaanyị bụ na nwoke ọbụla wara akwa anaghị enwe ihe mgbagwoju anya n’ihi na akwadoro ya nke ọma, o tozue etozue ibanye n’ọkwa alụm di na nwunye. Ọzọ bụkwa na nwoke ọ bụla wara akwa agaghị anọ nkịtị ma ọ lụọ nwaanyị n’ihi na a kụziri ya ọtụtụ aka ọlụ ọ ga-eji wee na-enyere onwe ya aka.
N’oge ahụ ka nne na nna nwaokorobịa ahụ na-awa akwa ji egosipụta ihunanya ha nwere ebe nwa ha nwoke ahụ nọ nakwa igwa ohaneze na nwa ha nwoke ahụ etozuola ịlụ nwaanyị.
Ọ ga-emekwa ka ụmụ okorobịa ndị ọzọ na-enwe agụụ ịwa akwa oge ọbụla ha hụrụ ụmụokorobịa ndị ọzọ wachagoro akwa nke ha ma lụọ nwaanyị.
I ji mata ma ndị mmadụ ọ maara maka ịwa akwa,onye nta akụkọ anyị gbara ụfọdụ mmadụ ajụjụ ọnụ.
Ụkọchukwu Mmaduabuchukwu Vincent Olisakwa, onye Omogho nke dị n’Orumba ‘North’ na-agbasa oziọma na ‘Holy Ghost Ministry’ dị n’Awka kwuru na ịwa akwa bụ otu esi akwadobe nwoke site n’ime ka ọ mara ihe ọ na- aba na ya. O kwuru na ọ bụ ụzọ nne na nna si e gosipụta na ọ bụ ihe dị mkpa ka nwa ha nwoke gaa lụta nwaanyị.
N’otu aka ahụ ka o kwukwara na O dịịrị ndị enyi nwa okorobịa ahụ, ndị wagoro akwa ga na- agwakwa ya, ka o wee nwee ike ịwa akwa. O kwuru na mgbe ụfọdụ, ọ naghị adi ofere makana onwere ike ọ bụrụ na ọ nweghị ego ma ọ bụ aka ọlụ nke nwere ike ime ya ọ dị ka onweghị mmasị iwa akwa. O kwukwara na iwa akwa bụ ezigbo ihe n’ebe ụmụokorobịa ndị tozugoro etozu iba n’alụm di na nwunye ma kwesịkwa na a ga-enye ha nkwado pụrụ iche n’ala anyị bụ Nigeria.
Nwada Gloria Nwude, onye Nkwelle Akwa, na-alụ di n’Umuokpu Awka kwuru na ọ dị nnukwu mkpa na nwaokorobịa ọ bụla tozuru etozu ga- awa akwa ka o wee nwee ike inedo ezinaụlọ ya anya maka na ọ bụrụ na ọ waghị akwa tupu ọ lụọ nwaanyị, ọ ga-enye ya nnukwu nsogbu makana mgbe ahụ ọ na-awa akwa ka a ga-akuziri ya ọtụtụ aka ọlụ dị iche iche ka ọ ga-abụ ọ chọọ ịlụ nwaanyị,o wee nwee ike ime ihe dị na ya.
Ọ gara n’ihu kwuo na mgbe nwata nwa okorobịa ahụ ga-alụ nwaanyị, na a ga-enye ya ihe ndị o kwesịrị iwekọta maka na agbaghị aka alụ nwaanyị. O kwuru na emume ịwa akwa ka na-aga n’ihu n’Umuokpu Awka.
O kwuru na mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na nwoke awaghị akwa tupu ọ lụọ nwaanyị na onwere ike ọ bụrụ na ndị be ha ji ego, ha nwekwaziri ike inye ya ego ahụ ka o wee ga lụta nwaanyị na awaghị akwa.
Mgbe ụfọdụ, onye mụtara otu nwa nwoke nwere ike nye ya ego ka ọ gaa lụọ nwaanyị ma ọwaghị akwa n’ihi na nne na nna ya gbachi ya nkịtị, o nwere ike ite aka