ỌTỤTỤ ụlọ na ugbo abụrula ndị nke a gbara ọkụ n’ihi ọgbaghara nke dapụtara n’etiti ndị Umuemu Anam na ndị Nzam, obodo dị n’okpuru ọchịchị Anambra West nke steeti Anambra. Nsogbụ ahụ dapụtara bụ nke e kwuru na ọ bụ n’ihi esemokwu sitere n’ịzọ ala nke dị n’etiti obodo ndị ahụ.
Dịka otu onye ọnọ ka o mere si kwu, ndị ntorobịa obodo abụọ ahụ ji egbe wee na-achụsasị onwe ha mgbe ha gbachara ọtụtụ ụlọ na ala ubi ọkụ ma mebisịa ọtụtụ ihe.
Dịka o si dị, ha ji ịgba egbe wee yie onwe ha egwu mana o nweghị onye meruru ahụ.
Esemokwu ahụ bụ nke nọrọla ọtụtụ oge ma bụrụkwa nke mebiri ndụ na akunauba n’oge gara aga.
Onye uweoji na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ bụ Mazị Haruna Mohammed, onye kwuru na ya bụ nsogbu dapụtara n’eziokwu, kọwara na ndị ọlụ nchekwa, nke gụnyere ndị uweoji na ndị amị nọzị n’ebe ahụ ma hụ na nsogbu ahụ dajụrụ.
Haruna gara n’ihu kwuo na aka akparala mmadụ abụọ bụ ndị a na-enyo enyo na aka ha dị na ya bụ nsogbu ma tinyekwa na kọmishọna uweojii na steeti Anambra bụ Mazị Garuba Umar enyela iwu ka elebaa ya bụ okwu anya nkeọma iji wee mata ebe mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ ka e wee kpee ikpe dịka o kwesịrị.