N’ỊGBASÒ mkpebì ya imemìla ịkpọ ma ọ bụ ịtụ mgbere ọgwụ ike n’ala anyị, ụlọ ọlụ ahụ a mà àmá n’ibu agha megide ọgwụ ike, bụ ‘National Drugs Law Enforcement Agency’ (NDLEA), anwụchikọọla mmadụ iri abụọ a na-enyo ènyò na ha na-atụ mgbere ọgwụ ike na steeti Anambra.
Onyeisi ụlọ ọlụ ahụ na steeti Anambra, bụ Maazị Sule Momodu mere ka a mara nke a n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụbọchị Tuzdee n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ. Dịka ọ bụ ihe a ma ama na a dịghị aka àkà eje nta agwọ, Maazị Momodu kwùrù na ndị ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ na ngagharị mberede ndị otu ụlọ ọrụ ahụ mere nso nso a na steeti ahụ, na nkwadobe maka nhọpụta izùgbe na-abịa n’ihu.
O kwùrù na mkpocha na nzàcha ahụ e mere bụ nke dabàrà adabà nnọọ, n’ihi mkpùghe ahụ e kpùghèrè na ụfọdụ ndị na-egwu okwe ndọrọ-ndọrọ ọchịchị na-enyegasị ndị ntorobịa ọgwụ ike n’oge dị ugbu a, ka ha wee ñụọ, chefùo onwe ha ma kpaa aghara ma ọ bụ nwekwa ike ịbàgide n’ọtụtụ ihe dị iche iche na-ebute nsògbu n’oge nhọpụta.
O jiri ohere ahụ dọọ ndị na-egwu okwe ndọrọ-ndọrọ aka na ntị, ka ha kwụsị ịkwàdò ma ọ bụ itinye aka n’ihe ọbụla na-ebute ọgba aghara ma ọ bụ nsògbu na nhọpụta ahụ a ga-eme, ma mekwa ka a mara na ụmụ ọrụ ya ga-agakwa n’ihu n’ịbàgide na mkpocha na nzàcha ahụ, wee rukwaa mgbe e memìlachara ndị niile na-etinye aka n’ịkpọ ọgwụ ike na steeti ahụ.
O kwupùtara njìkere nke ụlọ ọrụ ahụ dị ijikọ aka ọnụ, ya na ụlọ ọrụ nchekwa ndị ọzọ dị iche iche, iji hụ na e nwèrè udo na ezi nchekwa, tupuu, e mebe, ma ọ bụ e mechaa nhọpụta ọchịchị ahụ a ga-eme n’ala anyị, ma mekwazie ka a mara na onye ọbụla a ga-ejide ga-abụ onye a ga-akpụpụ ụlọ ikpe ma were iwu nyụchaa ya anya.