OTU nwoke aha ya bụ Simon Ugbala, onye gbara afọ iri atọ na ise egbuola nwunye ya, ụmụ ya abụọ na mmadụ anọ ndị ọzọ. Njiji ahụ jiri n’Onyikwa Nkaleke, Ozibo nke dị n’okpuru ọchịchị Ebonyi nke dị na steeti Ebonyi.
E kwuru na nwoke ahụ merụkwara mmadụ anọ ndị ọzọ ahụ bụ ndị ọnọdụ ha dị njọ ma bụrụkwa ndị na-anara ọgwụgwọ na ‘Federal Teaching Hospital,’ Abakaliki.
Ugbala bụ onye a hụtara dịka onye nwere ọrịa isi mgbaka bụ onye e kwuru na o jirila mma chụọ ọtụtụ mmadụ ọsọ n’oge gara aga ma tinye isi n’ọhịa mgbe ndị ntorobịa chụbara ya.
Onye okwupụta okwu ndị uweojii bụ Loveth Odah kwuru na ya bụ ihe mere eme n’ezie; ma kọwaa na ekwesighị ịhapụ ụdị mmadụ ahụ ka ọ nọrọ n’obodo, na o kwesịrị ka a kpọga ya n’ụlọọgwụ ebe a na-agwọ ọrịa isi mgbaka.
Otu o sila dị, Odah kwuru na ndị uweojii na-achọzi ya bụ nwoke maka ịnwụchịkọ ya.