Ọrịa ‘Lassa Fever’ ebidola ọzọ na Nigeria

0
477

NDỊ ụlọ ọlụ ‘Nigeria Centre for Disease Control’ ekwuputala na ọrịa ‘Lassa Fever’ agbasakwala na ala anyị bụ Nigeria. Ha kwuputara nke a n’ihi ọtụtụ ọnụọgụ ndị na-arịa ya bụ ọrịa bụ ndị nke a chọpụtara kemgbe afọ a na steeti dị iche iche.

Dọkịnta Chinwe Ihekweazu, onye isi  NCDC bụ onye kwuputara nke a n’Abuja kwuru si: “A chọpụtara na ọrịa ‘Lassa Fever’ na-abawanye site n’ozi nke si na steeti dị iche iche n’ala anyị kemgbe mbido afọ a. Mgbe ọnwa Jenụarị dị n’abali iri na atọ ka a achọpụtara na mmadụ iri isii na-arịa ya bụ ọrịa na steeti asatọ.”

Ihekweazu gara n’ihu kwuo na ọ bụ site n’ ozi ndị si steeti dị iche iche gbasara ọrịa ahụ ka ‘Nigeria Centre for Disease Control’ (NCDC) ji kwuo na ya bụ ọrịa agbasaala.

Ọ gakwara n’ihu kwuo na eguzobego otu ọlụ ‘Emergency Operations Centre’ (EOC) iji buo agha megide ọrịa ahụ. Ọ rụtụrụ aka na EOC gụnyere ‘World Health Organisation’ (WHO), US Centre for Disease Control’ na ọtụtụ ndị ọzọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here