September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

A ga m aga n’ihu na-enye ndị be anyị ezi nnọchi anya – Umeh

NWA amadi ahụ na-anọchi anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra Etiti n’ụlọ ọgbakọ Sineeti ala anyị, bụ Maazị Victor Umeh ekwunwòóla njìkere ya ịga n’ihu n’inye ndị ọgbọ nta nkwàdo ahụ na ụmụafọ Igbo niile ezi nnọchi anya, iji hụ na okè ha efughị cháá cháá.

Maazị Victor Umeh kwupùtara nke a n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra oge ọ gara ịgbape achụmnta nkwàdo ya na mpaghara ahụ maka nhọpụta izùgbe ahụ na-abịa n’ihu n’ala anyị. O kwùru na ya agbago ọtụtụ mbọ pụtara ìhè ma mepụtakwa ọtụtụ ihe a hụrụ anya na nkenke mgbe ọ nọgòró n’ụlọ ogbakọ sineeti ahụ, gosipụta njìkere ya ime nke ka nke o megòrò eme ma ya gaghàchi, ma kpọkùkwazie ndị ọgbọ nta nkwàdo ahụ niile ka ha tụnyere ya na otu ndọrọ ndọrọ APGA na nhọpụta ahụ, iji mee ka ezi nnọchi anya dị otu ahụ gaa n’ihu ma gúzosie ike.

Na ntụnye nkè ha n’otu n’otu, onyeisi oche otu ndọrọ ndọrọ APGA n’okpuru ọchịchị Idemili, bụ Maazị Kentus Ọnwụrah na onyeisi oche nchere ogè n’okpuru ọchịchị ahụ, bụ Maazị Raphael Nnabụife kọwara Umeh dịka nwoke maara nke ekwe na-akụ n’ịnọchite anya ndị nke ya na n’ọrụ ya dịka onye omebe iwu n’ihi ihe dị iche iche dara ụdà o mègoro na nkenke oge ọ nọgòrò ebe ahụ, ma kpọkuo ndị okpuru ọchịchị ahụ nakwa okpuru ọchịchị niile dị n’ọgbọ nta nkwàdo Anambra Etiti ka ha kwàdo ya bụ agụ nwoke nke ugboro abụọ na nhọpụta ahụ na-abịa n’ihu iji sị ya jìde ka o ji.

N’otu aka ahụ, nwa amadi ahụ ji aha otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị APGA apụta maka ịzọ ọkwa nnọchi anya ọgbọ nta nkwàdo Idemili North na Idemili South n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu ala anyị, bụ Maazị Ifeanyịchukwu Ibèzi, na ògbò ya nke ji aha otu ahụ apụta ịzọ ọkwa nnọchi anya ọgbọ nta nkwàdo Idemili North n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, bụ Maazị Ifeanyị Chiekwu bunyere Sinetọ Umeh ụkpa ekele maka ọrụ ọma ya na sineeti na nwa ntàkịrị oge a o nọgoro ebe ahụ, ma kpọkuo ndị ọgbọ nta nkwàdo ahụ ka ha kwàdo ya ọzọ ma kwàdokwazie ndị ọzọ niile ji aha otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ azọ ọkwa dị iche iche na nhọpụta izùgbe ahụ a ga-eme, n’ihi na nke dị n’ihu ga-aka nke o megoro ele.

Ndị ọzọ kwuru okwu na ya bụ mmemme gụnyere eze ọdịnala Uke, bụ Igwe Charles Agbala; onyeisi ọchịchị obodo ahụ bụ maazị Chuks Ezeọba, tinyere ndị ọzọ.

A nọkwara na ya bụ mmemme achụm nta nkwàdo wee nye ụmụnwaanyị dị iri abụọ na otu ego nkwàdo dị puku naịra iri ise n’otu n’otu site n’aka Maazị Victor Umeh, ebe ndị okpuru ọchịchị ahụ jikwara otu olu na ọñụ wee kwuwaa ma gosipụta nkwàdo ha nye Maazị Victor Umeh, I ji sị ya gaba n’ihu na egwu adịghị, na nhọpụta izugbe ahụ na-abịa abịa.

%d bloggers like this: