NNUKWU onye okaikpe steeti Anambra bu ‘Hon Justice’ Peter N.C Umeadị atọhapụla ndị nga mmadụ iri anọ na otu.
Otu a ka ọnụọgụ ha si dị: ụlọnga Nnewi, mmadụ iri na ise; Ekwulobịa, iri na atọ; Onitsha, iri na ato; nke gbakọtara dị ndịnga iri anọ na otu bụ ndị Justice Umeadi tọhapụrụ. Ọ fọziri ụlọnga nke dị n’Awka.
O mere nke a mgbe o mere njem nleta n’ụlọnga ndị ahụ. Imirikiti ndị ahụ a tọhapụrụ bụ ndị nọrọla ọtụtụ oge n’ụlọnga n’ekpeghị ha ikpe.
Justice Umeadị toro ndị ọlụ nile n’ụlọikpe bụ ndị nọ mgbe ọ na-eme, ha gụnyere ndi okpe ikpe, ndị uweojii, ndị ọlụ ụlọnga maka mbọ ha. Justice Umeadi chetaara ndị ọlụ ụlọnga na ụlọnga abụghi maka ndị afọ ha erubeghị ije nga (under aged) n’ihi na ọ na- abụ ihe ichere aka mgba n’ebe ọdịnihu na akaraka ha dị. N’ime mmadu iri na atọ ọ tọhapụrụ n’ụlonga Aguata nke dị n’Ekwulobia, mmadụ abụọ n’ime ha di n’agbata afọ iri na abụọ na afọ iri na anọ.
Ọ dọkwara ndị ọ dị n’aka maka ịgbapụta mmadu ‘bail’ ka ha kpachara anya maka ịnara ego n’ihi na ọ bụ mpụ bụ ime otu ahụ.
N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, onyi isi ụlọnga na steeti Anambra bụ Emmanuel Nwakeze toro Justice Umeadi maka ịgbata ọsọ enyemaka bụ nke o kwuru na ọ ga-enye aka belata ọtụtụ mmadụ ịnọ n’ụlọnga steeti ahụ.
Ọ kpọkuru ndị ahụ a tọhapụrụ na nga ka ha bụrụ ndị na erubere iwu obodo isi, hapụ ije ọjọọ ka ha ghara ịlọchigha azụ n’ụlọnga.