Kelekwaa Chineke
OKE ọñụ dara na Nnewi na nso nso a dịka bishọọpụ ụka Katọlik nke Dayọsis Nnewi bụ Most Rev. Hilary Paul Odịlị Okeke mere emume icheta ọgbụgba afọ iri asaa na abụọ n’elu ụwa. E mere emume ahụ n’ogige ebe a na-alụ ‘Blessed Iwene Tansi Priests Center,’ Nnewi.
N’okwu ya n’aja maasi, Bishọọpụ Okeke kelere Chineke maka onyinye nke ndụ ma kọwaa na ya nwere nsogbu oge a mụrụ ya nke mere nne na nna ya jirir baa ya Odilinyechukwu. O kwuru na aha a abụrụla nke pụtara ihe taa.
Bishọọpụ Okeke, n’oge o mere emume ọgbụgba afọ iri asaa, tinyere ihe nile o nwetere na ya bụ emume maka ịlụ ogige ‘Blessed Iwene Tansi Priests Center’ sikwa otu ahụ mee na nke a.
O tinyekwara ihe nile o nwetere n’emume nke a maka ịlụchapụ ya bụ ọlụ. Ọ kpọkuru ndị mmadụ maka nkwado ma kọwaa na ebe ahụ mgbe a lụchara ya ga-abụ ebe ndị ụkọchukwu ga na-elepụ anya (recreation) ma bụrụkwa ebe ozuzu ike ha mgbe ha mere agadi.
Na mbụ n’okwuchukwu, onye nkuzi na ‘Blessed Iwene Tansi Major Seminary’, Onitsha, bụ ‘Rev. Fr’ P.D. Akpụnọnu, kelere Chineke maka ndụ Bishọọpụ Okeke. Ọ kpọkuru ndị ụkọchukwu ka ha gbasoo nzọ ụkwụ onye dị asọ ‘St Agnes’ bụ nwanyị na-amaghị nwoke ma bụrụkwa onye e gburu maka Chukwu. Okwuru sị: “Agnes dị asọ bụ ezigbo ọmụmatu ịjụ ihe nke ụwa. Ihunanya ya n’ebe Jesu nọ na-ere ka okụ”.
Fr Akpunonu bụ onye kuzigooro otụtụ ndị ụkọchukwu ndị gụnyere Bishọọpụ Okeke dụrụ ndi ụkọchukwu ọdụ ka ha tinye uche n’ọlụ mbụ na mbụ ha bụ ịkụtara Chineke mkpụrụobi.
E kpere ekpere pụrụ iche n’isi Bishọọpụ Okeke nke ndị ụkọchukwu, ndị bishọọpụ abụọ nọ ya bụ Most Rev. Peter Okpalaeke na Jonas Benson Okoye, ndi echichi na mmadụ nile tinyere aka ha na ya.
Onye isioche mmemme ahụ bụ Dọkita Cletus Ibeto gwara ndị nwere ihe na dayosis ahụ ka ha kwado ya bụ ọnya ego maka ilụchapụ ogige ndị ụkọchukwu ahu.
Ibeto, onye bụ onye isi ‘CEO Ibeto Group,’ nyere ezi nkwado ma kwekwa nkwa ịhụ na a lụchara ya bụ ọlụ n’oge.
Sir Uchenna Umeh (Uchesonmary), onye nyekwara nkwado ya kwere nkwa ịbụ onyeisioche mgbe Bishop Okeke ga-eme emụme ịgba iri afọ asatọ.
Ucheson Mary kpere maka ogologo ndụ na ahụ ike n’isi Bishop Okeke onye nke ọ kọwara dịka onye obi umeala na onye igba ume n’ebe mmadụ nile nọ.