ỌRỊA ‘Lassa Fever’ bụ ọrịa ọjọọ. A chọpụtara ya n’ala Nigeria afọ iri ise gara aga.
Ọ bụ oke na-akpata ya, mana ọbụghị oke nile. Oke ndị na-akpata ya na-ebi n’ọhịa. Ha na-esi n’ime ọhịa na-abata n’ime ụlọ mmadụ wee na-etinye ọnụ ha n’ihe oriri. Ọ bụ n’ụzọ dị otu a ka mmadụ si ebute ọrịa ọjọọ a.
Ọ bụ eziokwu na ọ na-aka njọ n’oge ọkọchị mana ọ na-adigide n’afọ nile.
Dịka ndị otu ‘Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) si kwu, ọrịa ‘Lassa Fever’ bụ nke mmadụ na-enweta site n’iri nri oke ndị ahụ nyụnyere amịrị na nsị. Mmadụ na-ebutekwa ọrịa a site n’aka mmadụ ibe ya site na mmetụta ọbara, amịrị, nsị na ihe ndị ọzọ si n’ahụ onye ọ na-arịa pụta.
Iji gbanarị ajọ ọrịa a, mmadụ kwesịrị ichekwa ihe oriri nke ọma site n’idebe usekwu ya ọcha ma na-akpọchikwa ya mgbe nile.
A ga na-agbasakwa ihe oriri nke a chọrọ ka ọ kpọọ nkụ n’ebe dị ọcha.
Ihe e ji eri nri dịka ite, efere na ngazi kwesịrị ka a na-asa ya asa tupu e were ha tinye ihe oriri.
Mgbe ọbụla mmadụ nwere ahụ ọkụ, o kwesịrị ka ọ gaa ụlọọgwụ iji chọpụta ma ọ bụ ‘Lassa Fever’ n’ihi na e mee ngwa ngwa, e meghara ọdachị.