MGBASA ozi bụ ụzọ e si eme ka ndị mmadụ mara ihe ha kwesiri ima nke ọma makana ịghọta ihe a na- ekwu nke ọma, ị gaghị ada ada okwu. Ọ bụrụ na agbasaa ozi n’obodo ma ọ bụ n’ọgbakọ ọ bụla, ọghọm anaghị adị na ya.
Ọ dị ụzọ dị iche iche e si agbasa ozi n’oge gara aga na oge ugbua. N’oge gara aga, obodo ọbụla nwere ụzọ ha si agbasa ozi dị mkpa nye ndị obodo ha. Ihe e ji agbasa ozi n’ ime obodo ndị a gụnyere ekwe, ogene, opi na ikoro. Ikoro abụghị ihe a na-akụ mgbe nile n’obodo, ọ na -abụkarị agha dị, onye eze nwụọ ma ọ bụ ozi bụ nani ndị okenye ka achọrọ ka ha gbakọọ. Ọ dịkwa obodo ọ bụ opi ka ha ji agbasa ozi nke ha.
Mana oge ugbua, ọ dị ụzọ dị iche iche e si agbasi ozi nye ndị mmadụ. E nwere ụlọ mgbasa ozi n’ikuku a kporo ‘radio’, e nwere ụlọ mgbasa ozi n’akwụkwọ a kpọrọ ‘newspaper’, e nwekwara ụzọ mgbasa ozi a na- etinye n’igwe na- ekwupụta okwu n’ elu ụgbọala ma ọ bụ e jide ya n’aka. Ụzọ ndị a nile bụ ka e mee ka onye ọ bụla na- esonye n’ihe a na-eme n’obodo.
Ọ dịkwa ọghọm na-adị n’obodo ma ọ bụrụ na enweghị ezi mgbasa ozi ma okwu pụta. Oge ụfọdụ, tutu amara ihe na-eme, ndị aghọtaghị maka okwu ahụ pụtara agaba n’ụzọ nke ga-ebute itufu ndụ na akụ na ụba ndị ala ahụ.
Ihe ọghọm dị n’enweghị ezi mgbasa ozi kariri akari. Oge obiri n’aja ọcha bidosiri, n’ihi enweghị ezi mgbasa ozi maka ọgwụgwọ ọrịa ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ na ya. Ọrịa ekpenta, ụkwara nta na ọrịa ndị ọzọ dị iche iche gburu ọtụtụ ndị mmadụ n’ihi enweghị ezi mgbasa ozi. Mgbasa ozi bụ ọlụ kwesiri na a ga- elebe anya nke ọma maka na ọlụ ahụ ga-eme ka udo na- achị mgbe nile n’akụkụ ọ bụla. Ezi mgbasa ozi ga eme ka mmadụ nile mara ihe kwesiri ka ha mara ma nwee anya udo.
Ihe ọ bụla nwere ọghọm nwekwara uru. N’ezie, ọ dị ọtụtụ uru dị n’ezi mgbasa ozi n’akụkụ na mpaghara ọbụna. O kwesiri ka ndị nọ n’ ọchịchị na mba ọ bụla na- elebara ndị ọlụ mgbasa ozi anya nke ọma maka na ha so na- enye aka eme ka akọ na uche ndị ha na-achị na-akpakọ ọnụ site n’ịgwa ha ihe bụ ezi okwu nakwa ụzọ ka mma iji na-eme ihe ọbụla bara n’iru ha, ka udo wee na-achị.