September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

CAN etoola Chineke maka ịzọpụta Osinbajo

NDỊ isi ‘Christian Association of Nigeria (CAN)’ añụrịala n’ihi ihe ọma mere osote onyeisiala Nigeria bụ Ọkammụta Yemi Osinbajo, onye nke pụtara n’ihe mberede helikọpta kpọtụrụ na Satọdee gara aga na Kabba nke dị na steeti Kogi.

Onyeisioche otu ahụ bụ Rev Samson Ayokunle n’ozi ya n’Abuja nke sitere n’aka onye ndụmọdụ ya pụrụ iche na mgbasa ozi bụ Pastor Adebayo Oladeji kelekwara Chineke maka ịzọpụta Osinbajo.

O kwuru si “Ndị isi CAN na-ekele Chineke ma sorokwa gọọmentị etiti na Osinbajo na-añụrị. Anyị na-enye Chineke otito maka ichekwa ndụ osote onyeisiala na ndị otu ya site n’ihe mberede helikọpta ka ha na-agbagharị maka inweta ndị nkwado nye otu ndọrọndọrọ ọchịchị  ha n’ihi ‘election’ nke na-abịa abịa.

Onye ụkọchukwu ahụ chetara na osote onyeisiala nwere ụdị ọgbatauhie ahụ n’afọ 2018 mgbe ọ na-aga njem na ‘Nigeria Customs College’ nke dị na Gwagwalada, Abuja.

Ọ gakwara n’ihu kpee ka Chineke na-aga n’ihu na-echekwa ya na ndị isi ọlụ gọọmentị ndị ọzọ.

Ọ dọro ndị ọ dị n’aka ịlụ na idozi ugboelu na helikọpta ndị ọlụ gọọmentị ji eme njem n’ala anyị aka na ntị ka ha kee aji n’ume ma tinyekwuo uchu n’ọlụ ka ha ghara itinye ndụ ha na nsogbu.

O kpere ekpere sị, “ka Chineke na-agawanye n’ihu na-echekwa ala anyị, ndị ndu anyị na ndị ala anyị nile n’aha Jesus.”

%d bloggers like this: