September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

E liela ozu Oriakụ Comfort Okonkwo n’Ihite Orumba

Dịka a sị na ụwa bụ ahịa, onye zụchaa nke ya, ọ laa, e liela ozu Oriakụ Comfort Madụbom Okonkwọ n’ezinaụlọ be di ya dị n’ime ogbè Ụmụọkparukwu dị n’obodo Ihite n’okpuru ọchịchị ‘Orumba South’ nke steeti Anambra.

Mmemme akwamozu ahụ bụ nke a màlitere site n’ụka onye nwụrụ anwụ a kaara ya bụ agụ nwaanyị n’ụlọ ụka ‘St James Anglican Church, Ihite’ ma bụrụkwa nke bishọọpụ ụka Anglikan na dịyọsiisi Agụata, bụ, Bishọọpụ Samuel Ezeọfọr nọ n’isi ya.

N’okwuchukwu ya n’ofufe nro ahụ, Bishọọpụ Ezeọfọr kọwara ọnwụ dịka ụgwọ onye ọbụla dị ndụ ji n’ụwa ma bụrụkwa nke a na-akwụ naanị otu ugboro, nke, mgbe ọ gasịrị, ikpe esochie ya azụ.

O mere ka a mara na n’ụbọchị ikpeazụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ bànyere otu o siri bie ndụ ya, ma kpọkuzie, dụọ onye ọbụla ka ọ hazie ndụ ya ma kwadoo onwe ya nke ọma, n’ihi na o nweghị onye ma ahọ, ụbọchị ma ọ bụ oge òkù ọnwụ nke ya ga-akpọ ya, e wee chịkọta ije ozi ya ma nyekwa ya ụgwọ ọrụ ruuru ya site n’aka onye kere ụwa.

Mmemme akwamozu ahụ bụ nke dọtara ọtụtụ ndị selitere isi n’ọrụ gọọmenti, ndị isi ụka, ndị ndú obodo dị iche iche na ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị iche iche, nke gụnyere Archbishọọpụ nke ‘Enugu Ecclesiastical Province’ bụ ‘Most Rev.’ Emmanuel Chukwuma; Bishọọpụ ụka Anglịkan na dayọsiisi Otukpo, bụ Bishọọpụ David Bello; ode akwụkwọ izugbe steeti Anambra, bụ Maazị Solo Chukwulobelụ; kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti Anambra, bụ C-Don Adịnụba, nwa amadi jibụrụ ọkwa dịka kọmishona na-ahụ maka gburugburu n’oge mbụ, bụ Maazị Romanus Ejikeme, onyeisi ụlọ ọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation, bụ Maazị Chuka Nnabụife, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ, bụkwa ndị dụrụ ezinaụlọ nke ahụ metụtara ka ha dìbé ma nwee olile anya na Chineke enyela mkpụrụ obi nne ha ezi ezumike udo.

Tupuu ụbọchị ọnwụ ya, Oriakụ Comfort Okonkwọ, bụ onye gbara ahọ iri asaa na isii, bụ ezi onye òkwùkwe, onye òtù echichi Night nke St. Christopher n’ụka Anglikan ma bụrụkwa nne Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu na steeti Anambra, bụ Maazị Mike Okonkwọ, nakwa afọ mụrụ onyeisi ụlọ ọba ego Fidelity, bụ Maazị Nnamdị Okonkwọ, tinyere ndị ọzọ.

%d bloggers like this: