Ọ BỤ nnọọ oge mmepe anya, oge ịgbanwè echiche obi na oge ịkpọlite mmụọ ndị mmadụ, dịka ọba akwụkwọ steeti Anambra sonyeere mba ụwa n’imerubè mmemme ụbọchị ọrịa mkpụrụ akị, bụ ọrịa ‘cancer’ n’aha bekee, site na mmemme ịkọwara na ịgbasara ọhanaeze ozi banyere ya bụ ọrịa.
Oke mmemme ahụ bụ nke e mere site na njikọ aka nke ‘Gran Hermano Academy, Awka’, bụrụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ezumeezu nke ụlọ ụka ‘St. Anthony Catholic Church, Ihembosi’ dị n’okpuru ọchịchị Ekwusigo na steeti Anambra, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee nye nkuzi, jụọ ma zaa ajụjụ banyere ọrịa mkpụrụ akị
Na nkụzi ya na mmemme ahụ, otu onye selitere isi na ngalaba ọrụ ahụike, bụ Oriakụ Geraldine Ikenwa kpọpụtasịrị ma katọọ ụfọdụ akparamagwa na ụdị ihe ndị ọzọ na-ebi ahụike aka ọjọọ, bụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme ma ọ bụ na-etinyesi aka na ya n’oge ugbu a, nke gụnyere iri oke ihe ọtọ bụrị bụrị, isè anwụrụ (n’ụdị ọbụla),
iji ànwà nri na-ezighị ezi wee sie nri, iri oke nnu, ịrụ oke ọrụ ezughị ike, mmadụ iji aka ya enye onwe ya ọgwụgwọ, ịñụ oke mmanya na-aba n’anya, iri ọtụtụ nri a gbakọrọ na mkpọ na ndị e tinyere na komkom, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ, bụ ndị o kwuru na ha na-ebibì ọnọdụ ahụike mmadụ ma na-ebikwa onye ahụ aka ọjọọ, ma oge ọ na-eme ya ma n’ọdịnihu.
N’aka nke ọzọ, ọ kpopụtasịkwara ụfọdụ ihe ndị ọzọ na-akwàlite ọnọdụ ahụike mmadụ, nke gụnyere iri nri zuru òkè na nri ọdịnala n’oge kwesiri ekwesi, izù ike nke ọma, iri ọtụtụ mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri, imesàpụ ahụ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ, ma kpọkuo ndị bịara mmemme ahụ ka ha na-eme ihe ndị ahụ, ma na-akpọtụrụkwa dọkịta ha oge ọbụla ha nwebere mmetụta na-ezighị ezi na mpaghara ahụ ha ọbụla, n’ihi na aka nke ahụ na-enye n’igbochi ọrịa oge ọ ka na-ebido ebido.
Na mbụ n’okwu mmalite ya, onye ji ọkwa dịka onyeisi ọba akwụkwọ Kenneth Dike dị n’Awka, bụ Dọkịta Nkechi Udeze, onye kọwapụtara oke urù ụbọchị ahụ bàrà, chetaara ndị bịara ọgbakọ ahụ na ọrịa mkpụrụ akị enwekwaghị onye ọ sọrọ nsọ, maka ndị na-eche na ọ bụ naanị ụmụnwaanyị na-arịa ya; ma kpọkuokwa onye ọbụla ka o were ụdị òhèrè ọma dị otu ahụ wee kpọrọ ihe, n’ihi na ihe gbasaara ahụike mmadụ abụghị ihe e kwesiri iji na-egwù egwu ma ọ bụ ihe e kwesiri ịgbakụta azụ n’ihi oke ịchụ ego, maka na ndụ mmadụ karịrị ihe e jị azụ ya.
N’ịgbakwasa ụkwụ n’isi okwu mmemme ahụ nke ahọ a, nke bụ “A Bụ M.., M Gà..” (I Am And I Will), dọkịta Udeze mere ka a mara na n’okpuru ndu ya dịka onyeisi, na ọba akwụkwọ steeti ahụ malitere isonye n’imerube mmemme ahụ kwa ahọ ọbụla kemgbe ahọ 2016, n’ihi oke uru nke ahụ bàrà, nakwa otu ọrịa mkpụrụ akị ahụ sizị agbasàwanye n’ike n’ike ma na-egbuzịkwa ndị mmadụ gwòò gwòò kwà ahọ ọbụla, ma kpọkukwazie onye ọbụla ka o weputa onwe ya ma tụnye ụtụ nke ya n’ịgbasa ozi na ibu agha megide ya bụ ajọ ọrịa n’ebe ọbụla ọ hụtara onwe ya.
Na nkụzi nke ya, bụ nke o weturu ala nke ọma n’ụzọ ọ ga-ekwe nghọta, onye ọrụ ahụike ọzọ nyere nkuzi na ya bụ ọgbakọ, bụ Dọkịta Arinze Ijezie kpọpụtasịrị ma kọwaa ụdị ọrịa mkpụrụ akị dị iche iche e nwere, otu ha si eme nakwa ụzọ a pụrụ isi gbanahị ma ọ bụ gbòchie ha n’oge tupuu ha agazuo n’akụkụ ahụ ndị ọzọ. Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe ndị ga-enyere mmadụ aka inwe ezi ahụike, ma dụọ onye ọbụla ka ọ na-aga enyòcha ọnọdụ ahụ ya oge ọbụla iji memilaa ma ọ bụ gbochie ọrịa n’oge.
N’ozi ekele ya, otu onye selitere isi n’obodo Ihembọsị ma bụrụkwa onye sonyere nke ọma na mmemme ahụ, bụ Maazị Chinweikpe Iwuchukwu kọwara mmemme ahụ dịka nke magburu onwe ya, kelee ndị chịkọbara ya, ma dụkwazie ọhanaeze ka ha tinye ihe niile ha mụtara ebe ahụ n’ọrụ iji nwee ezi ọnọdụ ahụike bụ ịgbà.
Mmemme icheta ụbọchị ọrịa mkpụrụ akị na mba ụwa bụ nke malitere n’ahọ 2000 na nnukwu ọgbakọ mba ụwa e nwere banyere ya bụ ọrịa, bụ nke weere ọnọdụ na mba Paris, ma bụrụkwa nke a na-eme kwà ahọ ọbụla iji wee gbasaa ozi megide ọrịa ahụ, kụziere ndị mmadụ ihe ha kwèsìrì ịma bànyere ya, ma buokwa agha megide ya n’ụzọ dị iche iche.