AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ agagharịala n’ụfọdụ ebe dị iche iche e ji ọlụ n’aka na steeti ahụ iji mara ka ọrụ si aga n’ebe ndị ahụ.
N’okwu ya dịka ọ gara ileta ọrụ ngo okporo ụzọ ahụ siri Umueje gaa Agụleri, Gọvanọ Obianọ kwuputara afọ ojuju ya banyere otu ya bụ ọrụ si aga nakwa ogoogo e ji arụ ya. Ọ kọwara ụzọ ahụ dịka nke ga-enye aka n’ịkwàlite mmepe na ọnọdụ akụnụba nke ndị mpaghara ahụ na mpaghara Ọmambala niile n’izugbe ma a rụchaa ya, ma tòkwazie ndị obodo abụọ ahụ ndị nuputara n’ìgwè ịbịa nabata ya na mpaghara ha, ọ bụnadị ka ọ rịọrọ ha ka ha kwàdo ma tụnyere ndị dị iche iche ji aha otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị ‘All Progressive Grand Alliance (APGA)’ apụta ịzọ ọkwa dị iche iche na mpaghara ahụ na nhọpụta ahụ na-abịa n’ihu n’ala anyị.
N’okwu nke ya, otu n’ime ndị sonyere ya na njem ahụ, ma bụrụkwa kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka ọrụ, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọr gwara ndị obodo abụọ ahụ na ya bụ ụzọ, bụ nke dị kilomita iri na otu na ụma asaa ma nweekwa àkwà mmiri, bụ nke a ga-arụchapụ oge adịghị anya, site n’aka ‘Estrader Constructions’ bụ ụlọ ọrụ ngo ji ya bụ ọrụ.
Na ntụnye nke ya, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Anyamelụm n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, ma bụrụkwa onye ji aha otu ndọrọ-ndọrọ APGA apụta ịzọ ya bụ ọkwa ọzọ, bụ Maazị Uche Okafor kelere Gọvanọ Obianọ maka njèm ahụ ọ bịara. O toro ya maka ọtụtụ ihe dị iche iche ọchịchị ya mepụtagooro ndị mpaghara ahụ, ma kwe ya nkwà na ndị okpuru ọchịchị Ayamelum niile ga-aga n’ihu n’ịkwàdo otu ndọrọ ndọrọ APGA.
N’akụkọ dịkwa ka ibè ya, Gọvanọ Obianọ gakwara ọtụtụ ebe ndị ọzọ dị iche iche e ji ọrụ ngo na steeti ahụ iji mara ka eke si anya anwụ.
Ebe ndị ahụ gụnyere okporo ụzọ ahụ siri Mmịata Anam wee gaa Nzàm, bụ nke dị kilomita iri na ụma abụọ ma nwee àkwà mmiri dị mita otu narị na iri abụọ; na àkwà mmiri Nengo dị mita iri atọ na isii, bụ nke jikọrọ Nteje na Ụmụnya dị n’okpuru ọchịchị Oyi, ma bụrụkwa nke ọrụ na-akụrụzị ọnụ na ya ugbu a.
Ndị sonyere Gọvanọ Obianọ na ya bụ njèm gụnyere kọmishọna na-ahụ maka ọrụ, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọr, ògbò ya nke na-ahụ maka ọnọdụ azụm ahịa, bụ Maazị Christian Madụbuko, tinyere onyeisi ụlọ ọrụ ‘Project Management and Monitoring Office’ na steeti ahụ, bụMaazị Mike Ogbuekwe, ndị ndu obodo, ndị eze ọdịnala na ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù n’otu ndọrọ-ndọrọ APGA.