AKA na-achị steeti Anambra bụ Willie Obianọ ègùzobela òtù nhàzi ọhụụ maka ụlọ ọrụ ‘Anambra State Universal Basic Education Board’ (ASUBEB) na ụlọ ọrụ ‘Post Primary Schools Service Commission’ (PPSSC), ma gwa ha ka ha tinye uchu ma were obi ha rụọ ọrụ.
Ngùzobe ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’obi gọọmenti dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụ nke a nọrọ na ya wee duo ndị ọhụụ ahụ n’iyi ọrụ, bụ ndị ga-anọ n’isi ụlọ ọrụ abụọ ahụ malite ugbu a wee ruo n’ahọ ise na-abịa abịa.
N’okwu ya dịka ọ na-egùzobe ndị ahụ, Gọvanọ Willie Obianọ dụrụ ha ka ha jigidesie ike, ezi nzọ ụkwụ na agbam mbọ ndị nke rịturu arịtu n’ọkwa, ma mee karịa ka ha mere, dịka o mere ka ha mara na gọọmenti steeti ahụ akwụchaala ụgwọ niile maka ọrụ na ihe ndị ọzọ na-aga n’ihu n’usoro agụm akwụkwọ steeti ahụ, ma dọọkwa ha aka na ntị ka ha wèré ọrụ ha kpọrọ ihe.
O chetaara ha na ọkwa ahụ abụghị ihe nrita ha, nke bụ na a pụkwara ịnapụ ha ya ma ọ bụrụ na a nụ akụkọ ọjọọ ma ọ bụ chọpụta ihe ọbụla na-adịghị aga nke ọma banyere otu ha sì arụ ọrụ, n’ihi na ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ achọghị ihe ọbụla ga-adọchigha ọrụ ọma ya azụ ma ọ bụ dọghachi aka elekere azụ n’ihe metụtara ọganihu na mmepe nke steeti ahụ.
N’okwu nke ya, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka agụm akwụkwọ, bụ Ọkammụta Kate Omenụgha chetaara ndị ahụ na ha nwere ọtụtụ ọrụ chere ha n’ihu, dụọ ha ka ha gbasie mbọ ike ma mee karịa ka a tụrụ anya n’aka ha. O kwupụtakwara njikere nke minịstịrị ya dị inye ha ezi nkwàdo n’ụdị ọbụla na n’oge ọbụla, ma kpọkuo ha ka ha ghara igbu oge n’ikwuputa ihe iche aka mgba ọbụla ha nwere ike izu n’ihu ọrụ.
N’ụlọ ọrụ ‘Anambra State Universal Basic Education Board’ ndị ọhụụ ahụ e gùzòbere gụnyere: Maazị Ejike Ụgbọaja, dịka onye isi oche; Oriakụ Vivian Anyadubalụ, dịka ode akwụkwọ; ebe Oriakụ Gladys Edowor, Dọkịta Peter Ekemezie, Oriakụ Grace Adichie na Oriakụ Nọnye Udegbunam bụ ndị òtù ahụ.
N’ụlọ ọrụ ‘Post Primary Schools Service Commission’, Oriakụ Ifeọma Okaro ka e gùzòbèrè dịka onyeisi oche, gùzobe Oriakụ Patty Offia dịka osote onyeisi oche, ma guzobekwa Oriakụ Ngọzị Ọnụọrah dịka ode akwụkwọ izùgbe; ebe Maazị Joe Enemụọ, Oriakụ Francisca Okeke, Dọkịta Ngọzị Agbasimelo, Oriakụ Phillin Odenigbo na Dọkịta Blessing Eberechukwu bụkwa ndị òtù nhàzi ahụ.