September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Omenala

OMENALA dịka a kọwara bụ ihe anyị na-eme, otu anyị si adị ndụ, ihe anyị na-eri na ihe anyị na-etinye n’ahụ na otu anyị si eke ekike ma ọ bụ eji ejiji, ihe e jiri mara anyị dịka mba, abụ anyị na-abụ, egwu anyị na-ete, omume na agwa anyị na- akpa ya na ihe anyị kwenyere na ya.

Omenala pụtara otu ndị si ebi ndụ ha. Ọ bụ omenala ndị ka e ji mara ha. Ọ bụ nke a mere na ọ dị nnukwu mkpa na ndị ọbụla ga na-echekwa omenala ha. Agbụrụ ọbụla enweghị omenala nwụrụ anwụ. Omenala ndị metụtakwara asụsụ ha, agụmagụ ha, nkwenye dị iche iche ha nwere, ekpemekpe ha na mmemme dị iche iche ha na-eme. Ndị ọ bụla na-azulitekwa ụmụ ha n’ụzọ ha si ebi ndụ ha; nke a pụtara na omenala anyị anaghị anwụ anwụ kama ọ na- etowanye kwa mgbe kwa mgbe n’ihi na ọ na-anabata mgbanwe ma ọ bụ ihe ọhụrụ dị iche iche site n’omenala ndị ọzọ.

Iji maa atụ, omenala Igbo nabatara ihe dị iche iche site n’omenala ndị agbatobi ha dịka Igala, Idoma, Edo, Ibibio na Efik. Otu aka ahụ kwa, mgbanwe dị iche iche adila n’omenala ndị Igbo site na mmekorịta ndị Igbo na ndị bekee. Nke a mere na mgbe ọ bụla anyị na- amụ ihe gbasara omenala Igbo, anyị ga na-eleba anya nke ọma iji chọpụta otu ọ dị n’oge gboo na etu ọ dị ugbu a.

Ọ bụ eziokwu na anyị kwenyere na omenala ga na-etowanye site na inabata ihe ndị dị mma n’omenala ndị ọzọ, ma ọ dịkwa mkpa ka omenala ọzọ ghara ilo ya.

Na nwa oge gara aga, ọ dị ka a ga-asị na ọtụtụ ndị Igbo hapụrụ omenala ha, ma na-agbaso omenala ndị ọcha. Ọtụtụ ndị Igbo aghọtala na ọ dị nnukwu mkpa na anyị ga-echekwa omenala anyị ma kwalitekwa ya.

 

 

%d bloggers like this: