September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Ụlọ mgbasa ozi ANPC akpọkọtala ndị na-azọ ọchịchị maka nrụrịta ụka

DỊKA otu ụzọ ịkwadobe nhọpụta ọchịchị ahụ na-abịa n’ihu n’ala anyị n’afọ a, ụlọ mgbasa ozi ‘Anambra Newspapers And Printing Corporation’ bụ ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ ‘National Light’, Ka Ọ Dị Taa na ‘Sportslight Xtra’ ejikọọla aka ọnụ, ya na ọtụtụ ụlọ mgbasa ozi ndị ọzọ dị na steeti Anambra wee hazie ma chịkọba nrụrịta ụka maka ndị ji aha otu ndọrọ-ndọrọ dị iche iche azọ ọkwa sineeti na mpaghara ọgbọ nta nkwàdo sineeti atọ e nwere na steeti ahụ.

Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ezumezu dị n’ogige isi ụlọ ọrụ National Light dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ndị na-egwu okwe ndọrọ-ndọrọ, otu jikọtara ndị otu nkịtị dị iche, ndị nta akụkọ, tinyere ọhanaeze na òtù ndị ọzọ.

N’okwu mmàlite ya maka ya bụ nrụrịta ụka, onyeisi ụlọ ọrụ National Light, bụ Chuka Nnabụife mèrè ka a mara na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji mara banyere ntozu-okè onye ọbụla n’ime ndị ahụ na-azọ ya bụ ọkwa ọchịchị, ebumnobi ya nyegara ndị ọ na-achọ ịnọchite anya ha, ihe ndị dị oke mkpa ọ ga-ebu ụzọ chụsò ma o nweta nturu ugò, tinyere ihe ndị ọzọ e kwèsiri ịma bànyere ya, dịka o sìrì metụta ọkwa ọchịchị ahụ ọ na-azọ, iji nyere ndị mmadụ aka ịtụnyere ma họpụta onye kacha ma, onye kachara tozù òkè na onye kachara mara nke ekwe na-akụ n’ihe gbasaara ọchịchị na nnọchi anya.

Ọ kọwara ya bụ nrụrịta ụka dịka mkparịta ụka n’etiti ndị na-azọ ọkwa ọchịchị na ọhanaeze, ma kwuo na ọ ga-enyekwa aka bèlàtà ịkọtọ mmadụ, ibugharị okwu asị na ozi na-abụghị eziokwu banyere ndị na-egwu okwe ndọrọ-ndọrọ, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ ọ ga-eweta, n’ihi na onye ọbụla ga-eji ntị ya wee nụrụ site n’ọnụ onye ọbụla n’ime ndị ahụ na-azọ ọchịchị kwọnkwem. Ọ kọwakwazịrị nke ahụ dịka otu n’ime ọtụtụ ọrụ dị iche iche ụlọ mgbasa ozi nwere, bụ nke mezịrị ha jiri hibe ya bụ mmemme, ma tòkwazie ụlọ mgbasa ozi dị iche iche sonyere na nke ahụ.

Ezekwelu

Ka ọ na-azagasị ajụjụ na mmemme ahụ bànyere ihe o jiri hụta onwe ya dịka onye kachara tozu òkè iji ọkwa ahụ ọ na-azọ, otu n’ime ndị sonyere na nrụrịta ụka ahụ, ma bụrụkwa onye ji aha otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị ‘People Democratic Party’ (PDP) azọ ọkwa ịnọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra Etiti n’ụlọ ọgbakọ sineeti ala anyị, bụ Oriakụ Uche Ekwunife  kpọpụtasịrị ụfọdụ n’ime ahụmahụ na mmụta o nwetagoro n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu etiti abụọ e nwere n’ala anyị bụ ebe ọ nọgòrò opekata mpe, ihe ruru ahọ iri na isii, jiekwa ọkwa dị iche iche na ha, ma mee ka a mara na nke ahụ emeela ya nnọọ ka ọ bụrụ ọkacha mma n’ihi na o sitela na ha wee mara nke ekwe na-akụ n’ihe metụtara ezi nnọchi anya na imebe iwu.

Ọ kpọpụtazịkwara iwepute atụmatụ iwu ga-akwàdó ma chekwabakwa ikike dịịrị ụmụ nwaanyị, kwàlite udo na ịdị n’otu, ezi nchekwa, na ọdịnihu ndị ntoro, tinyere inye ndị ntorobịa na ụmụnwaanyị nkwàdo, dịka ụfọdụ n’ime ihe ndị ọ ga-ebu ụzọ chụsòó ma o nweta nturu ùgò.

N’azịza nkè ya banyere ajụjụ ndị ahụ, onye ọzọ sonyere na ya bụ nrụrịta ụka ma bụrụkwa onye ji aha otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị ‘African Democratic Congress’ (ADC) azọ ọkwa ịnọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra Etiti n’ụlọ ọgbakọ sineeti ala anyị, bụ Maazị Tony-Uche Ezekwelụ kpọpụtasịkwara ma kọwasịa ahụmahụ, nnụcha na mmụta dị iche iche o nwetàgoro n’ebe dị iche iche o jigoro ọkwa dịka onye ndu na onye nnọchi anya, nke gụnyere ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra, otu jikọtara ụmụakwụkwọ niile n’ala Nigeria, bụ ‘National Association of Nigerian Students’ (NANS), otu Ọhanaeze Ndị Igbò, otu jikọtara ndị ntorobịa niile n’ala anyị, tinyere ọtụtụ òtù ndị ọzọ, bụ ebe o mepụtasịkwara ọtụtụ ihe dị iche iche dara ụda, bụzị nke mere e ji akpọ ya ‘Ọchịagha Ndị Ntorobịa, ma kwuo na ihe ndị a niile ákwádóla ya ma mee ka ọ bụrụ onye tózùrù òkè na onye kacha mma iji ya bụ ọkwa ọ na-azọ.

Ekwunife

O kwuru na isi sekpụ ntị n’ihe ndị ọ gà-achụsò ma o nweta nturu ùgò gụnyere: ikwuchite ọnụ ndị Igbo, ichekwaba na ịgba mbọ hụ na e mezùpùtara ọchịchọ obì ndị Igbo; ịgba mbọ ka e nwògharịa ọdịdị na ọnọdụ nke ala anyị site n’ime ka mpaghara ọbụla kwụụrụ onwe ya ma gharazie ịdabèrè na gọọmenti etiti; ịkwàdò ndị ntorobịa na ụmụnwaanyị; itinye atụmàtụ ìwu ka e gbòchie ndị ọchịchị izipụ ụmụ ha mba òfèsi ịga gụọ akwụkwọ, iji hụ na e nwògharịrị ọnọdụ agụm akwụkwọ ala anyị, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

N’ajụjụ ọnụ a gbárà ha bànyere nrụrịta ụka ahụ, onyeisi oche òtù jikọrọ òtù ndị òtù nkịtị dị iche iche e nwere n’ala anyị (Civil Society Organizations) ngalaba steeti Anambra, bụ Maazị Chris Azor, na nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Willie Obianọ n’ihe gbasaara agụm akwụkwọ ogoogo sekọndịrị, bụ Maazị Paul Ifeanyị kọwara ya bụ mmemme dịka nke magburu onwe ya, n’ihi ọtụtụ uru dị iche iche nke ahụ ga-ewèta site n’inyere ndị na-atụ akwụkwọ aka ịmara ma tụnyere ndị kacha tozu òkè na ya bụ nhọpụta na-abịa n’ihu, tinyekwuoro na ọ ga-abụ ihe ijide ndị ahụ na mbé, ihe ha ga na-elekwàsị anya wee na-arụ ọrụ ma ọ bụrụ na ha nweta nturu ùgò, nakwa ihe a pụrụ iji kpọchigha akọnaụche ha oge ọbụla ha malitere ịda mbà n’ọrụ ha, ime nke na-ezighị ezi ma ọ bụ ịgbakụta nkwà ha kwere azụ.

Ha kwara arịrị ma katọọ otu ụfọdụ ndị na-egwu okwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị ugbu a sizị agbakụta nrụrịta ụka azụ, bụ nke a kpọrọ ha isonye na ya iji wee gwa ndị mmadụ ebumnobi ha bànyere ọkwa ha na-azọ; ha wee site n’ụzọ dị otu ahụ na-agharịpụ ndị mefùrù ọtụtụ ego iji hazie ya bụ ọgbakọ na ìgwè mmadụ ndị bịara ịnụrụ ọnụ mmiri okwu ha dịka ndị na-achọ ịnọchite anya ha na gọọmenti, ma kọwaa na nke ahụ na-egosi nnọọ na onye dị otu ahụ bụ onye na-enweghị ihe ọ chị, onye na-elelị mmadụ nakwa onye ngharịpụ dị n’ọbara ya, n’ihi na ọ ghaghị ịga n’ihu na-agharịpụ ndị mmadụ ma ọ bụrụ na o mechagodu bànye n’ọkwa ahụ.

Ha kelezịkwara ndị ahụ na-egwu okwe ndọrọ-ndọrọ, bụ ndị bịara abịa, maka iweputa oge ha, ma kpọkukwazie ọhanaeze ndị gere ntị ka ha werezie uche ha tụlee ma mara onye kacha tozu òkè na onye kachara nwe ezi ebumnobi bànyere ha, iji wee tụnyere onye dị òtù ahụ na nhọpụta ahụ na-abịa n’ihu.

%d bloggers like this: