ỌJI bụ mkpụrụosisi ndị Igbo na-akwanyere ugwu nke ukwuu. Ọji bụ mkpụrụosisi a na-akụ akụ mana ọ na-epuru onwe ya. Ọji nwere ike ịmị n’ụlọ ma mịkwaa n’ọhịa. Ndị Igbo kwenyere na enwere ụdị ọji dị iche iche, ụfọdụ na-aza aha site n’etu o si mịpụta.
Abịa na Nigeria, enwere ọji Igbo ma nwee ọji ugwu Awụsa ma nwekwaa nke ndị ọdịda anyanwụ bụ ndị Yoruba. Ọji Igbo na-agbakarị n’ibe site n’atọ ruo ibe asaa. Igbo na-akwanyere ọji gbara ibe asaa ugwu, ụfọdụ na-egbukwa ọkụkọ ma ha hụ ya bụ ọji.
Ndị Igbo kwenyere na ọji bụ ihe a ga-ahụrịrị n’emume dị iche iche. Ọji dị oke mkpa n’omenala ndị Igbo maka na Igbo kwere na onye wetara ọji wetara ndụ.
Abịa na ibe ole ọji na-agba, , ndị Igbo kwenyere na ọji gbara otu ibe a bụghị ezigbo ọji maka na a naghị ata ya ata. A na-akpọ ya ‘ọji ogbi’. Nke gbara ibe abụọ, ndị Igbo na-akpọ ya ọji kuchara ‘aka’, nke gbara ibe atọ a na-akpọ ya ọji ‘ikenga’, nke gbara ibe anọ na-egosi ahịa anọ enwere n’ala Igbo- Eke, Orie, Afọ, Nkwọ.
Enwere ọji gbara asaa a na-akpọ ọji ọmụmụ. Mgbe ọbụla a wara ọji ọ gbaa asaa, a na-egbu ọkụkọ ma sie nri n’ihi na ọbụ ihe ọma na abịara onye ahụ wetara ya.
Abịa na ala Igbo enwere uru dị iche iche ọji bara dịka ị nabata onye ọbịa, eji ọji a nabata onye ọbịa n’ala Igbo. Ọ dị nnukwu mkpa na onye okenye ọbụla ga-enwe ọji na be ya makana ọji bụ nnukwu ihe nakwa ihe izizi a na-enye onye ọbịa.
Nke dịkwa ka ibe ya bụ na eji ọji añụ iyi nakwa igba ndụ, abịa ebe a na añụ iyi ma ọ bụ ebe a na-agba ndụ.
Abịa n’ala Igbo, e ji ọji alụ nwaanyị dịka ịgba nkwụ nwaanyị, ime ego nwaanyị, wdgz. E jikwa ọji edozi esemokwu dị na etiti mmadụ na ibe ya, eji ya achụ aja werekwa ya na akwa ọzu.
N’ala Igbo ,ọji nwere nsọ. Ụfọdụ ndị mmadụ jizi ọji eme ihe sọrọ ha, ụfọdụ aghọọ ya aghọọ. Ụdịrị agwa a adịghị mma. Nwaanyị anaghị arị elu ọji ma ọ bụ ghọtuo ọji. A naghị ezu ohi ọji, anaghị agọ ọji ebe mmadụ nwụrụ. Ndị Igbo kwenyere na ọji anaghị anụ bekee n’ụzọ ọbụla ya mere e ji ya eme mmemme dị iche iche.
Maazị Ogujiofor Patrick nke si Awator Nimo, kwuru na uru dị na ọji bụ na eji ya anabata onye ọbịa mana ọ bụrụ na ọjị adighị, e nwere ike iji ihe ọzọ mee ọji. O kwuru na a naghị ezu ohi ọji mana ọ daa n’ala, na onye ọ bụla nwere ike ịtụtụrụ ya. O kwukwara na nwaanyị anaghị awa ọji.
Nwada Gloria Nwude onye Umuokpu Awka kwuru na uru ọji bara bụ na-eji ọji ele onye ọbịa, na ọji na egosi na ị nabatara onye ahụ nke ọma mana ala Igbo nwaanyị anaghị awa ọji. Ọ bụrụ na okenye anaghị nso, nwoke ọ bụla nwere ike ịwa ọji. O kwuru na nwaanyị a naghị agọ ọji n’ala Igbo.