September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

A dụọla ndị na-agụ akwụkwọ ka ha na-ahụrịta onwe ha n’anya

DỊKA ọ bụ ihe dị oke mkpà, a dụọla ma kpọkuo ndị na-agụ akwụkwọ na ọhanaeze n’izugbe ka ha na-ahụrịta ibe ha n’anya ma na-egosirịta onwe ha obi ọma oge niile.

Onye ji ọkwa dịka onyeisi ọba akwụkwọ ọkammụta Kenneth Dike dị n’Awka, bụ dọkịta Nkechi Udeze nyere ndụmọdụ a n’okwu ọ gwara ndị na-agụ akwụkwọ na ya bụ ụlọ mmụta n’ọgbakọ oriri na ọñụñụ ọ chịkọbaara ha iji merube ụbọchị Valentine nke ahọ a.

Ọ kọwara ịhụnanya dịka ihe mmadụ kwesiri ịdị na-egosìpụta n’ebe mmadụ ibe ya nọ oge ọbụla, dịka ọ bụ ihe Chineke nyere n’iwu, ma kpọkuo onye ọbụla ka o na-akwàlite ezi mmekọrịta na ịdị n’otu n’etiti mmadụ na ibe ya.

Dọkịta Udeze tòrò ndị ahụ maka ịbịa n’ọba akwụkwọ ahụ agụ akwụkwọ, ma kwuputakwa ezi njikere nke ya bụ ọba akwụkwọ dị n’ịkwàlite mmụta na ọdịmma ha, bụ nke mere ha jiri wetuo ọnụ ego a na-akwụ maka ịnọ ebe ahụ gụọ akwụkwọ, ka ọ bụrụzie naanị narị Naịra atọ maka otu ahọ.

O kwere nkwà na ụlọ mmụta ahụ ga-aga n’ihu ịhụ na e nwere ezi ọnọdụ dị ahụ mma na akwụkwọ bara uru maka ndị na-abịa na ya bụ ọba akwụkwọ, ma kpọkukwazie ha ka ha jisie ike n’ịgụ akwụkwọ oge ọbụla, na n’iji ọba akwụkwọ ahụ wee kpọrọ ihe, n’ihi na mmụta bụ ihe dị oke mkpà na ihe mmadụ jikwa aka ibe ya. Ọ gwakwara ndị ahụ ka ha sonye n’ọtụtụ ọmụmụ ọrụ aka na ihe ọmụmụ ndị ọzọ dị iche iche na-aga n’ihu n’ọba akwụkwọ ahụ ahụ, iji wee nwe ike ịbụ ndị kwụụrụ onwe ha, ọ kachasị n’oge a ọnọdụ akụnụba ala anyị adịchaghịzị mma na ntị.

N’okwu nke ya, otu onye n’ime ndị ahụ na-agụ akwụkwọ n’ebe ahụ, bụ maazị Godknows Alaukwu kwuputara na afọ juru ya banyere ọnọdụ na mmụta ha na-enweta na ya bụ ọba mmụta na otu e si emeso ya n’ebe ahụ, tòó ma kpọkuo ha bụ ndị nhazi ọba akwụkwọ ahụ ka ha jide ka ha ji, n’ihi na ezi ọrụ ha ahụ bụ nnọọ nke na-amịta mkpụrụ a tụrụ anya n’obodo.

N’otu aka ahụ, otu ọnye ọzọ na-abịakwa n’ọba mmụta ahụ agụ akwụkwọ ma bụrụkwa onye ọrụ oyibo, bụ oriakụ Ify Okeke mere ka a mara na obi na-atọ ya ụtọ oge ọbụla ọ batara n’ọba akwụkwọ ahụ, ọ kachasị n’ihi otu ndị ọrụ nọ ebe ahụ si anabata ya, ezi ọnọdụ dị jụụ ọ na-enweta, na ihe dị iche iche ọ na-amụta. O bunyezịkwara ndị nhàzi ọba akwụkwọ ahụ ụkpa ekele, ma rịọ ha ka ha ghara ịda mba n’ọrụ.

E wezuga oke oriri na ọñụñụ weere ọnọdụ ụbọchị ahụ, ihe ndị ọzọ pụtakarịchara ihe na mmemme ahụ bụ ekpere e kpeere ndị na-abịa n’ọba mmụta ahụ agụ akwụkwọ, ọ kachasị ndị na-akwadobe ule maka ịba mahadum nakwa ule ndị ọzọ dị iche iche.

 

 

%d bloggers like this: