AKA na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ emeela ka a mara ezi mbọ nke ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ na-agba iji hụ na e tinyere ọkụ okporo ụzọ n’obodo niile dị na ya bụ steeti.
Gọvanọ Obianọ mere ka a mara nke a na Nibo dị n’okpuru ọchịchị Awka South oge ọ gara ịgbape na ịgbanye ọkụ okporo ụzọ ahụ siri Awka gaa Isiagu wee pụta Nibo. O kwuru na gọọmenti ya agbapeela ma gbanye ọkụ okporo ụzọ n’ihe karịrị obodo otu narị na iri abụọ, ma sị na ọ ga-aga n’ihu n’ime nke ahụ, ruo mgbe ọ gazuchara obodo niile ọnụ.
N’ihe gbasaara ịkwalite mmepe Awka bụ isi obodo steeti ahụ, gọvanọ Obianọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe dị iche iche, nke gụnyere itinyesi ọkụ n’ọtụtụ ebe dị iche iche, inye ọrụ ngo maka ịrụ na idozigharịsị ime okporo ụzọ dịgasị iche iche, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ, ma kọwaa na ọ ga-eji ahọ ole na ole ahụ fọdụụrụ ya n’ọkwa wee rụpụtakwuo ọtụtụ ọmarịcha ọrụ ga-enye aka n’iwulite ọdịmma steeti ahụ na n’ịkwàlite ezi ọnọdụ obibi ndụ ụmụafọ ya.
N’aka nke ya, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka akụrụngwa e ji akwalite ọnọdụ obibi ndụ ọhanaeze, bụ maazị Obi Nwankwọ kọwara gọvanọ Obianọ dịka onye na-enwe mmetụta banyere ọnọdụ ụmụ mmadụ na ihe na-agabiga, bụzị otu n’ime ihe mere o ji malite atụmatụ ịgbape na ịgbanye ọkụ n’Anambra.
Ọ kpọpụtasịrị ọtụtụ uru dị iche iche dị na nke ahụ, ọ kachasị ọnọdụ nchekwa na mmepe ọ ga-akwàlite, ma kọwaa ya bụ atụmatụ dịka nke magburu onwe ya na nke ga-akwàlite ezi ọnọdụ obibi ndụ ọhanaeze n’ụzọ pụrụ iche.
N’ozi ekeke ya, eze ọdịnala Nibo, bụ Igwe Michael Ngene bunyere gọvanọ Obianọ ụkpa ekele maka atụmatụ ọma ahụ, rịọ ya ka o jide ka o ji, ma kwuputakwa nkwàdo ha n’izugbe nye ọchịchị ya.