September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Fada Dike enyela nwatakịrị ohere agụmakwụkwọ n’efu iji kwalite asụsụ Igbo

ỤBỌCHỊ taa ọnwa Febụwarị dị n’abalị iri abụọ na otu ka otu ‘United Nations’ wepụtara dịka ụbọchị a na-emerube emumu asụsụ ndị ‘International Mother Language Day’.

Ọ bụ kemgbe Febụwarị afọ 2000 ka a malitere nke a iji kwalite asụsụ na omenala ndị na ihe ndị ọzọ so ya n’azụ.

Asụsụ dịka anyị maara na-ekwu ebe onye si. Ọ na-eweta ezi mmekọrịta, ịkparịtaụka, agụmakwụkwọ, mmepe w.d.g. Ọ bụ ya mere otu ‘United Nations’ ji akpọ oku ka a kwalite asụsụ ndị iji wee rite elele so ya. Ọ bụ site n’asụsụ ka agbụrụ niile ji ahafe omenala na njirimara ha site n’aka fere aka.

Otu ‘United Nations’ na-arụtukwa aka mkpa ọ dị iji asụsụ ndị nke bụ asụsụ mbụ mmadụ wee na-akụziri ya n’ụlọakwụkwọ, ọkachasị na mmalite. Nke a dị nnukwu mkpa n’ihi na ọ bụ asụsụ ndị ahụ na-asụ ma na-aghọtakwa nke ọma.

Asụsụ nile dị mkpa, nke a kpatara na onweghị nke a chọrọ ka ọ nwụọ. Ma otu o sila dị, asụsụ Igbo so n’asụsụ a na-ekwu na ọ bụrụ na amaghị ihe e mere ya, ọ ga-anwụ pịị. Ọ bụrụ na nke a mee, olee ụzọ a ga-esizi na-akuziri ụmụaka omenala na njirimara ndị Igbo? Kedu maka akụkọ ifo, ilu na ihe ndị ọzọ ndị Igbo ji akuziri ụmụaka ihe nke na-esi n’aka fere aka wee na-aga?

Ọ bụ ka asụsụ Igbo ghara ịnwụ mere otu dị iche iche ji agba mbọ ịkwalite ya dịka; Otu Subakwa Igbo nke Ọkammụta Pita Ejiofo nọ n’isi ya.

N’otu aka ahụ, ndị mmadụ dị iche iche na-agbalịsi ike ịhụ na asụsụ Igbo na-aga n’ihu. Ọ bụ ya kpalitere mmụọ otu ụkọchukwu, nke mere o ji nye nwata akwụkwọ ohere agụmakwụkwọ n’efu. Nke a mere n’ụlọụka ‘Arch- Bishop A.K Obiefuna Retreat, Pastoral and Conference Centre,’ Okpuno, nke dị n’okpuru ọchịchị Awka South ka ọnwa Febụwarị dị n’abalị iri. Aha ụkọchukwu ahụ bụ Rev. Fr. Obinna Dike. N’ihi na a na-akakarị ụka n’asụsụ bekee n’ụlọụka ahụ, Fr. Dike gwara ụmụaka ahụ na ọ ga-ajụ ha ajụjụ n’asụsụ Igbo, na onye ọ bụla zatara ya ga-enweta ohere agụmakwụkwọ n’efu.

Ọ rụọ ụbọchị ọzọ fada ahụ kara ụka, o wee jụba ụmụaka ahụ ajụjụ n’asụsụ Igbo. Ụmụaka pụtara dị ihe dịka ise. Ọ jụrụ ha aha nne na nna ha, tinyere ogbe, obodo, okpuru ọchịchị na steeti ha si pụta.

N’ikpeazu, nwatakịrị tuuru ugo bụ Otti Obed Osinachi. Aha nne na nna ya bụ Maazi Sam na Oriaku Vera Otti. Ha bụ ndị Itakwuna Ugbene-Ajima na steeti Enugu. Nwata a nọ na prima ogo nke anọ na ‘Angel Gabriel Nursery/Primary School’ Okpuno.

N’ajụjụ Ka Ọ Dị Taa jụrụ Fr. Dike mgbe a gbasara ụka, ọ kọwara na ebumnobi ya o ji wee kpebie inye ohere agụmakwụkwọ n’efu bụ maka iji wee kwalite asụsụ Igbo. O kwuru sị na ụmụaka nwere mmasi n’asụsụ Igbo na ọ bụzị nne na nna ka a na-agwa ka ha nyere ha aka. Ya mere Fr. Dike dụrụ ndị nne na nna ọdụ ka ha kee ajị n’ume kwado ụmụ ha nke ọma n’ebe asụsụ Igbo dị.

Nne nwata nwoke ahụ nwetara ohere agụmakwụkwọ n’efu bụ Oriaku Vera Otti kelere Chineke ma rịọ ngozi ya n’isi Fr. Dike. Ọ sịrị ka Chineke mejupụtara ya mkpa ya n’ihi na ọdịghị mfe mmadụ ime ụdị ihe ahụ n’ihe isi ike dị n’ala anyị ugbu a. O kwuru na ezigbo nwata na-ewetara nne na nna ugwu.

N’okwu nke ya, ụkọchukwu ya na Fr. Dike kara ụka bụ ‘Director’ na ‘Retreat Centre’ bụ Fr. Emeka Anene kelere ya maka ịbịa sonyere ha na aja maasị tinyekwara ịkwalite ụmụaka ha, na ọlụ ọma ya nile.

%d bloggers like this: