MMA (Beauty)

0
222

KERE kere ka ọ na-egbu

Ọbụnadị n’anya onye ìsì

Onye chi ya gọzìrì

O were nke ya, mebe ngàlá

 

Mma adịghị n’ótú Ọnịtsha

Maka na ihe dị ụtọ bu ihe dị ụkọ

Ọ bụ ezie na e nwere adịgbòlója

Mana ihe a gba n’aka

E jighi ènyò ele ya

 

Mma so n’ihe nwaanyị jiri ka ibe ya

Ọ bụghị naanị mma ihu

Ma ọ bụ ọcha ihu fanta ọkpọ kooku

Kama, ezi agwa bụ mma nwaanyị

 

Ụmụ nwoke nwere nke ha

Ọ bụghị naanị mma afọ ọnụ

Kama site na mpempe akwụkwọ na-esi ajọ isi

Maka na ego bụ mma nwoke

Onye nwekarịa, ọ makarịa

N’anya ụmụ nwaanyị

Na-agbanyeghị ole afọ ọnụ ya ha

 

Mma bụ ego

Mma bụ agwa

E nwerekwara mma ihu

Mma bụkwazị ihe ónwúnwé

 

Mma niile a dị mma

Mana ihe kacha mkpà bụ

Gịnị ka onye nwe ya jiri ya mepute

Tupu à tụnye ihe niile ahụ n’igbé

Maka na agbọghọ na-esu ùdù

Oge ya ana-aga

 

Mma nịịle nwere ebumnobi

Mma abụghịkwa ihe ngàlá

Mma abụghịkwa maka ịpịa ọkụ

Maka na otu ụbọchị

Ihe niile ahụ ga-aba n’ajọ ọcha

 

Lezie anya ma hazie mma nke gị

Ka i wee sòró àbàlà mụrịa amụ

Maka na mma na-agafe agafe

Abụkwa orechaara buusu goro nkịta

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here