September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Ndị uwe ojii anwụchikọọla nwaanyị na nwa ya maka izu ohi nwa

NDỊ uwe ojii na steeti Anambra anwụchikọọla otu nwaanyị na nwa ya nwaanyị maka izu ohi nwatakịrị nwaanyị gbara ahọ anọ na steeti ahụ.

Nwaanyị ahụ, bụ oriakụ Ngozi Ede na nwa ya nwaanyị, onye aha ya bụ Kaosisọchukwu Ede ka e kwuru na ha zuru ma ree nwata ahụ n’ọnụ ego dị puku narị Naịra abụọ na ụma iri ise n’Awada dị n’Obosi n’okpuru ọchịchị Idemili South.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze na ndị uwe ojii na steeti ahụ, bụ maazị Harụna Mọhammed kwuputara na ya bụ akụkọ bụ eziokwu. O kwuru na ya bụ nwaanyị gbara ahọ iri anọ na abụọ, ebe nwa ya nwaanyị gbara ahọ iri na asaa, ma kọwaa na a hafeela nwata ọhụụ ahụ n’aka nne ya.

Ọ gara n’ihu kwuo na nwata ọhụụ ahụ, bụ Mmesoọma Ikoko bụ onye gbara naanị ahọ anọ, ma bụrụkwa onye e zuuru n’ebe nne ya bụ oriakụ Nneka Ikoko na-elekọta ya anya. O kwukwara na site na nnyocha e mere, na a nwụchikọkwara nwaanyị ọzọ a na-akpọ oriakụ Ifeọma Okeke, bụ onye gbara ahọ iri anọ na ise, onye kpọọrọ nwata ahụ wee nyefee ya n’aka nwaanyị ọzọ a na-akpọ oriakụ Ifeọma Okonkwọ na-azụ ahịa n’Eke Nkpọr.

Na nchịkọta okwu ya, maazị Harụna ahụ kwuru na a ga-emekwu nnyocha miri emì banyere nke ahụ, nke mgbe ọ gachara, a kpụpụ ndị ahụ ụlọ ikpe ma were usoro iwu nyụchaa ha anya.

%d bloggers like this: