ITỤ akwụkwọ ndọrọndọrọ ọchịchị iji họpụta onyeisiala na ndị ga-anọchịte n’ụlọ nzukọ etiti ala anyị, nke a kaara ime na Satọdee gara aga mara afọ n’ala n’ihi na ndị ọ dị n’aka bụ ndị ‘Independent Electoral Commission (INEC)’ yigharịrị ya ka ọ dịbazie na Satọdee na-abịa abịa, ọnwa a ga-adị n’abali iri abụọ na atọ. Ọnọdụ a mere ndị mmadụ taa mechie ọnụ n’ihi na ọ bụghị ihe a tụrụ anya.
Na mpaghara Nodu Okpuno nke dị n’okpuru ọchịchị Awka ‘South,’ ndị mmadụ apụtaghị maka ịtụ akwụkwọ .
Ọdịghị ndị a hụrụ n’ụlọ ezumezu Nodu Okpuno na St Gabriel’s Parish Okpuno bụ ebe e kwesịrị ịnọ tụọ akwụkwọ.
Ọtụtụ ndị mmadụ kwuru na ihe ejighị wee hụ ndị mmadụ n’ebe ndị ahụ so n’ebe a na-atụ akwụkwọ bụ n’ihi na mmadụ nile anụchaala na a gaghị emekwa nhọpụta ọchịchị ụbọchị ahụ.
Kenneth Ezinwa bụ onye nche na St Gabriel kwuru na ya bịara ọlụ n’ụtụtụ ahụ ka ya nabatawa ndị mmadụ, ndị ga na-abịa maka ịtụ akwụkwọ, mana oge ya rutere, na ya chegidere ọdịghị onye ọ hụrụ. O kwuru na ọ bụ n’ikpeazu ka ya nụziri na agaghị emezi nhọpụta ọchịchị ụbọchị ahụ. O kwuru na e kwesịrị izi ozi n’oge, ihe dịka otu izuụka n’ihi na ọtụtụ ndị mmadụ si ala bekee lọta maka ịtụ akwụkwọ. Ọ gbaruru ihu ma kwuo na ọnọdụ dị otu ahụ na-emebi ihe.
N’akụkụ nke ya, Charles Nwuba kwuru na ọ bụ ndị ọ dị n’aka maara ihe ha ji yigharịa nhọpụta ọchịchị otu ahụ. O kwuru na anyị amachaghị ihe nile, na ọ bụ so ha maara.
Otu nwoke achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ya bụ ọnọdụ adịghị mma, na o wutere ya n’ụzọ pụrụ iche n’ihi na nwanne ya nwaanyị so n’ọlụ naara ya ego ọ ga-eji gba ụgbọala wee gaa ọlụ. N’ikpeazu, alụghịkwa ọlụ ahụ, o wee si otu ahụ tufuo ego na nkịtị.
Onye nke ọzọ kwuru na ha ji mgbede abali gaba obodo ha ga-alụ ọlụ nhọpụta, ha rahuru n’ụlọ akwụkwọ prima dị n’obodo ahụ ebe oyi nọ nyụọ ha ịkpakwu. Ka ha nọ ebe ahụ, n’ọnụ ụzọ ụtụtụ ka ha nwetere ozi na otu abụghịkwa n’ezi, nke pụtara na isi akwa adịghịkwa ebe a fanyere ya. O kwukwara na ya bụ ozi gbawara ha obi, na ha nọgidere ebe ahụ ruo mgbe chi fosara, ha were chọrọ ụzọ be ha ọ bụrụ ụla n’ihi na onye bịara iku nwa ọ nwụọ, onye ahụ ga-alaba.