A TỌRỌLA mmadụ iri na asatọ bụ ndị ji otu afọ ejere ala Nigeria ozi ‘National Youth Service Corps’ (NYSC); ndị ọlụ enyemaka ‘Independent National Electoral Commission (INEC) na Steeti Akwa Ibom. Nke a dapụtara n’oge nhọpụta onye isi ala na nke ndị nnọchite ‘National Assembly’ nke e mere.
Mike Igini bụ ‘Resident Electoral Commissioner (REC) gwara ndị nta akụkọ ka o si me.
A tọọrọ ha na mpaghara dị iche iche na steeti ahụ. Otu o sila dị, a hapụla ọtụtụ n’ime ha n’ihi mbọ nke ndị ọlụ nchekwa.