September 29, 2022

Ka Ọ Dị Taa

Akụkọ na edemede Obodo n’asụsụ Igbo

Ọba akwụkwọ Anambra emeela ụbọchị ncheta asụsụ na mba ụwa

Ụfọdụ ndị sonyere na mmemme ahụ.

Kpọọ oku ka a kwàlite asụsụ Igbo

 

Ọba akwụkwọ steeti Anambra esonyerela mba òtù mba ụwa n’imerùbè mmemme icheta ụbọchị asụsụ nke ahọ 2019, bụkwa nke a maara dịka ụbọchị asụsụ ọdịbendị.

Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ akwụkwọ ‘Adorable British Nursery and Primary School’, dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ụmụ akwụkwọ, ndị ọrụ oyibo, ndị nne na nna, ndị ọba akwụkwọ, tinyere ọhanaeze ndị ọzọ.

N’okwu ya dịka ọ na-akọwa uru ụbọchị ahụ bara, ihe e jiri hibe ya bụ oke ụbọchị na mba ụwa, na isi okwu nke mmemme ahụ n’ahọ a, onye ji ọkwa dịka onyeisi ọba akwụkwọ Kenneth Dike dị n’Awka, bụ dọkịta Nkechi Udeze mere ka a mara na ọ bụ n’ahọ 1999 ka e guzobere ya bu ụbọchị, site n’aka òtù mba ụwa a kpọrọ ‘United Nation Education Scientific and Cultural Organization’ (UNESCO) iji kwàlite ma chekwaba asụsụ mba dị iche iche ka ha ghara ịnwụ.

Ọ katọrọ akparamagwa ụfọdụ ndị nkuzi, ụlọ akwụkwọ, na ndị nne na nna bụ ndị Igbo, bụ ndị na-adịghị asụrụ ma ọ bụ kwe ka mmadụ sụọrọ ụmụ ha asụsụ Igbo, kama ha agakwuo n’ihu ịta nwata ọbụla sụrụ asụsụ Igbo ahụhụ; ma kwuo na nke ahụ so n’ihe tinyere asụsụ Igbo n’ọnọdụ anya mmiri ọ nọ na ya ugbu a, ma bụrụkwa nke nwere ike ime ya ka ọ nwụọ pịị n’oge adịghị anya, dịka otu UNESCO bùrù n’amụma n’ahọ 2012.

Dọkịta Udeze gara n’ihu kpọpụtasịa ọtụtụ uru dị iche iche dị na mmadụ ịma asụsụ ya, dụọ onye Igbo ọbụla ka o were asụsụ ya kpọrọ ihe ma kpọkuwazie ndị bịara ya bụ mmemme ka ha gbakwa mbọ mụta asụsụ ndị ọzọ dị iche iche ma e wezuga asụsụ Igbo, bụ nke o kwuru na ọ ga enyere mmadụ aka ịgbanahị ihe izè ndụ dị añaa, inweta ihu ọma, ikwukọrịta okwu nakwa ịnọkwata nke ọma n’ebe ọbụla ọ hụtara onwe ya.

Dịka o jiri ndị Hausa na ndị Yoruba wee maa àtụ dịka agbụrụ dị iche iche na-echekwaba ma na-asụsi asụsụ ha ike, o nyezịrị ezi nwaafo Igbo ọbụla ndụmọdụ ka ọ hụta asụsụ Igbo dịka ihe bara oke uru ma na-asụkwazị ya oge ọbụla na n’ebe ọbụla, iji wee hụ na ya bụ ọmarịcha asụsụ efughị ma ọ bụ nwụọ pịị dịka ndị amụma ndị UNESCO siri dị.

Na mbụ n’ozi nnọọ ya, onyeisi ụlọ akwụkwọ ‘Adorable British Nursery and Primary School, Awka’ bụ nwaada Norma Terry, nke onye nọchitere anya ya bụ onye nkuzi asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ nwaada Love-jane Osuọha tòrò ọba akwụkwọ steeti Anambra maka ịhụta ya bụ ụlọ akwụkwọ dịka ebe kacha mma ịchịkọba ya bụ mmemme.

Ọ kọwara asụsụ dịka ihe dị oke mkpa na ndụ mmadụ, kwaa arịrị banyere ọnọdụ asụsụ Igbo n’ala anyị n’ụbọchị taa, ma kpọkukwazie ndị Igbo n’ebe dị iche iche, ọ kachasị ndị nne na nna ka ha na-asụ ma na akụziri ụmụ ha asụsụ Igbo malite n’oge ha dị na nwata, na-agbanyeghị ebe, mpaghara ma ọ bụ mba ha bi na ya.

Ihe pụtakarịchara ihe na mmemme ahụ gụnyere: ịgụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ akwụkwọ edemede Igbo, egwu ọdịanala, egwuregwu ọdịnala na ihe ngosi ọdịnala ndị ọzọ nke ụmụ akwụkwọ ahụ gosiri, tinyere inye onyinye akwụkwụọ a kpọrọ ‘Saving Igbo Language From Extinction’ nakwa ‘Akwụkwọ Nkọwa Okwu Igbo’, bụ nke e nyere ụlọ akwụkwọ ahụ site n’aka ọba akwụkwọ ọkammụta Kenneth Dike, iji wee kwàlite mmụta na asụsụ Igbo na ya bụ ụlọ akwụkwọ.

 

 

%d bloggers like this: