OTU nwoke gbara afo iri isii, aha ya bụ Daniel Sakpe egbuola onwe ya n’Omobayi nke dị n’okirikiri Itapaji n’okpuru ọchịchị Ikole na steeti Ekiti.
Nwoke ahụ ji ụmụ ise ka a kọwara na ọ hapụrụ nwunye ya n’ihe dịka elekere iri na abụọ nke etiti abali n’ihi na ọ sị na ya chọrọ iga mposi.
Mgbe nwunye ya nọkatara ọ hụghị ya, o bidoro kpọba ya oku ma ọ zaghị. ọ kpọtere nwa ya bụ Rebecca o wee chọba nna ya.
Ọ bụzi Rebecca bụ onye chọtara nna ya ebe ọ kwụrụ ụdọ n’ime ụlọ ha, mgbe ọ gbara ọkụ o ji n’elu ụlọ (ceiling).
Ndị agbatobi gosịrị mgbagwoju anya n’ọdachi ahụ n’ihi na dika ha siri kwu, nwoke ahụ enweghị nsogbu ọbụla. Ha kọwakwara na ọ so na ndi nọrọ n’isi emume n’uka ụbọchị ahu.
Ozi si n’aka ndi uweojii kọwara na ndị uweojii Ikole ‘Police Station’ ebutela ozu ya ma na emezi nnyocha dị na ya.