ABALI iri abụọ na asaa nke ọnwa abụọ afo ọbụla ka ndi out nnọrọ onwe (Non Governmental Orgnisations(NGO) na mba uwa na- eme mmemme icheta nguzobe ha.
Otu nnọrọ onwe bụ ọtụ aka gọọmenti adịghị na ya. Nke a pụtara na ọbụ otu kwụurụ onwe ya na- eme ihe ọ chọrọ mgbe ọbụla ọ chọrọ ime ya. Ebu m n’obi otu a bụ inyere ndị mmadụ aka n’ ụzọ pụrụ iche nakwa ikwalite ndụ ndi mmadụ na anataghi ego.
Ha na- akwalite ndị mmadụ site na inyere ndị nọ na mkpa aka, inyere ndị ahụ ike ha adịchaghị mma aka, ikwchitere ndị agaghị ekwuchite ọnụ ha, ime ka ndị a na- emegbụ emegbu nweta ihe ruru ha nakwa inye ọzụzụ na ikuziri ndị mmadụ ihe n’ ọgbakọ dị iche iche. Otu a abụghi otu mkpata ego kama ọlụ ha bụ ịgba mbọ hụ na ihe na -aga nke ọma na ngalaba niile nke mba uwa.
Oteela otu a bidoro, a maara aha ha na mba ụwa niile. Ndị NGO bụ ndị malitere gbaba mgba ka emechie ịgba oru na mmegbu a na- emegbu umu nwaanyị na ụmụaka.
NGO pụtara ihe site na nguzobe nke Unietd Nations Organization n’ afọ 1945. Ọ bụ mgbe ahụ ka NGO malitere wube ewu na mba uwa.
Ọ dị ọtụtụ NGO na mba uwa niile. Edeba aha ha, akwukwo ga- eju mana ọlụ ha bụ ọlụ ebere na inyere ndi mmadu aka n’ ụzọ di iche iche.
Ọlụ ndi NGO bu inye aka ikpokọba ndi mmadu na ikụziri ha ihe. Maka na ọbụghi otụ mkpata ego, ọ dị mkpa na ha chọrọ ego iji lụ ọlụ. Ha ga-ario ego wee lụo ọlụ ka ha were zọpụta ndụ ndị nọ na mkpa site n’agha mọobụ site na nsogbu onatarachi. Ha chọo ibagide ọlụ, ha ariọọ ndi jị ego mọobụ goomenti ego iji lụọ olụ ha.
NGO nke Nigeria buru ibu nke ukwuu. Ha kere onwe ha ụzọ asatọ.Ha nwekwara ọlụ ọma dị iche iche ha na -alụ. Ndi niile nọ n’otu NGO bụ ndị jikọrọ onwe ha ọnụ ilụ otụ ọlụ, ime otu ihe na ilụ otu ezi ọlụ na inwe otu nkwenye nke oyibo kporo (common goal).
Ụfọdụ ọlụ maobụ ụzọ ndi otu NGO jii enyere ndi mmadu aka; inyere umu enweghi nne na nna aka, inyere ụmụ nwaanyi ajadu aka, ikwalite ndị enweghi ka oha ha, inyere ndị ntorobịa aka zụọ ha n’ aka ọlụ dị iche iche. Ha na- enye kwa aka ịkwalite ndị nọ n’ ime obodo site na ịzụ ha n’ ọlụ aka na inye ha ihe ha ga- eji bido ọlụ ma ha mụchaa ọlụ.
NGO soro mepe anya ndị nọ n’ obodo mepere emepe nakwa anya ndi nọ n’ ime ime obodo, ọkachasi otu ọgbakọ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ. Ọ bụ ụka na otu NGO mere ka ha na- enweta oke ruru ha n’ ebe ha lụrụ di. Ọ bụ ndị otu a mere ka afụfụ ụmụ nwaanyị na umuaka na-ata beleta dịka ọ di taa. Ndị otu NGO adịghị akwado ihe ọjọọ ọbụla dika agha, mmegbu ndị enweghị ike na ndị enweghi ka ọ ha ha. Otu NGO na- kwudosike na- ime ihe oma n’agbanyeghi ihe ọ ga- efu ha.