A kpọkuola ndị Anambra ka ha tụnyere APGA na ntụliaka ụbọchị Satọdee

0
538
Ụfọdụ ndị isi otu APGA si ime obodo dị iche iche bịa nzuko ha nwere n'ebe ndị mmadụ na-agbakọ a kpọrọ Ekwueme 'Square' n'Awka na nso nso a.

AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ akpọkuola ụmụafọ steeti Anambra ka ha tụnyere ndị dị iche iche ji otu ndọrọ ndọrọ ‘All Progressive Grand Alliance’ (APGA) azọ ọkwa ịga ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra na ntụliaka ahụ a ga-eme ụbọchị Satọdee.

Gọvanọ Obianọ kpọrọ oku a n’Awka oge ya na ndị ọrụ oyibo steeti ahụ na-akparịta ụka, bụkwazi nke ọ nọrọ na ya wee mee ka ha mara oke mkpà ọ dị na otu ndọrọ ndọrọ ahụ nwetara mmeri dara ụda na ya bụ ntụliaka. Ọ kọwara nhọpụta ahụ a ga-eme n’ụbọchị Satọdee dịka nke nwere ọtụtụ ihe so ya n’azụ, nakwa nke pụrụ inwe mmetụta pụtara ìhè n’ọchịchị steeti ahụ.

O mere ka a mara na dịka ọ bụ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị APGA ji ọkwa ọchịchị na steeti ahụ ugbu a, na ọ bụrụ na e nweghị ọkà n’ọnụ ọgụ ndị otu ndọrọ ndọrọ ahụ n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ, na o nwere ike ibì ezi ọchịchị dị na ya bụ steeti ugbu a aka ọjọọ, ma gbaghachikwa aka elekere azụ n’ebe o metụtara ịkwàlite ọdịmma ndị ọrụ oyibo steeti ahụ nakwa ebe o metụtara ya bụ ọrụ mmepe na-aga n’ihu ugbu a, n’ihi na ọ gaghị adịchazị mfe ịkwàdò atụmatụ ọrụ, atụmatụ ego ọrụ na ọmarịcha atụmatụ ndị ọzọ n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu ahụ, dịka e si eme ya ugbu a, maka na a ga-enwezị ọtụtụ ndị kwe na ndị ekweghị.

N’iji gbanahị nke ahụ, Gọvanọ Obianọ kpọkuzịrị ndị ọrụ oyibo steeti ahụ ka ha binyere otu ndọrọ ndọrọ APGA aka iji nweta mmeri dara ụda na nhọpụta ahụ.

GUO:  APGA azọpula ụkwụ ije siri ike maka ndọrọ-ndọrọ ọchịchị 2019

Na ntụnye nke ya, osote aka na-achị ya bụ steeti, bụ Dọkịta Nkem Okeke, onye kwuputara na ọ dị oke mkpa ka onye ọbụla bụ ezi nwaafọ steeti ahụ tụnyere otu ndọrọ ndọrọ APGA na nhọpụta ahụ, kpọpụtasịrị ọtụtụ ihe dị iche iche Gọvanọ Obianọ mepụtagoro n’ebe o metụtara mmepe izugbe nke steeti ahụ, nke gụnyere ịrụ na idozigharị okporo ụzọ n’ọtụtụ ebe dị iche iche na itinyesi ọkụ na ha, iwèta ezi nchekwa ndụ na akụnụba, inye obodo niile dị na steeti ahụ ego ka ha wee rụọ ihe dị ha mkpà, iji hụ na obodo ọbụla ritere úrù n’ọchịchị ya, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

Ọ rịọrọ ndị dị iche iche a kpasùrù iwe n’ụdị ọbụla n’otu ndọrọ ndọrọ ahụ ka iwe ha dàjụọ, ma kpọkuo ha ka onye ọbụla tinye aka na mbọ ahụ a na-agba ịhụ na ya bụ otu ndọrọ ndọrọ nwetara nturu ugo dara ụda ọzọ dịka o nwetara n’oge e mere ntụliaka maka ọkwa gọvanọ.

Na mbụ n’ozi nnọọ ya, onyeisi ọrụ oyibo na steeti ahụ, bụ Ọkaiwu Harry Udu chetaara ndị ọrụ oyibo ahụ ebe ha siri màlite nà otu ọnọdụ dịịrị ha na mgbe gara aga, bụ mgbe a na-eji ha ụgwọ ọrụ ọtụtụ ọnwa, mgbe a dịghị akwụ ha ụgwọ ịla ezumike nka, nakwa mgbe ha gabigara ihe iche aka mgba dị iche iche n’ịhụ ọrụ ha n’ihi otu e siri gbakụta ha azụ, wee ruo mgbe ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ bàtàrà n’ọkwa.

Ọ gara n’ihu chetara ha ihe ndị ọzọ ọchịchị Obianọ meere ha na nke ọ ka na-emere ha ugbu a, ma e wezuga ịkwụ ha ụgwọ ọnwa na ụgwọ niile ruuru ha n’oge na otu o kwesiri, nke gụnyere ibunye ha akpa osikapa n’ekeresimeesi ọbụla, iweputa ụgbọala e ji ebuta ma na ebula ha n’ọrụ site na mpaghara ebe dị iche iche ha si abịa, itinye ego n’ụgwọ ọnwa ndị ọrụ, idozigharịsị ụlọ ọrụ gọọmenti steeti ahụ, tinyere ihe ndị ọzọ, ma dụzie ya ka ha gosi Gọvanọ n’ọchịchị ya dị ha ahụ mma site n’ịtụnyere otu ndọrọ ndọrọ APGA na nhọpụta ụbọchị Satọdee ahụ.

GUO:  INEC ekesaala ihe a ga-eji tụọ akwụkwọ ụbọchị Satọdee

Na nzaghachi n’aha ndị ọrụ ahụ, onyeisi otu jikọtara ndị ọrụ oyibo na steeti ahụ, bụ Maazị Jerry Nnụbịa, kwere Gọvanọ Obianọ nkwà itinye ihe niile a gwara ha n’ọrụ site n’ịtụnyere otu ndọrọ ndọrọ APGA n’ùjú ụbọchị Satọdee, ma kwuputakwa nkwàdo ha nye ọchịchị ya, bụ nke o kwùrù na ọ dị ha nnọọ ahụ mma.

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here