MBA ụwa nile ga-eme ncheta ụmụnwaanyị, nke oyibo kpọrọ ‘International Women’s Day’ echi bụ na abali asatọ nke ọnwa atọ nke afọ a. Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị e ji echeta ọlụ na ịgba mbọ ụmụnwaanyị na mba ụwa nile.
‘International Women’s Day’ nke afọ a gbadoro ukwu na okwu a kpọrọ “The Future is Exciting: Let’s Build a Gender Balance World”. Okwu a na-akọwa na onye ọ bụla nwere ihe ọ ga na-eme mgbe ọ bụla, ebe ọ bụla ọ nọ.
Ọ bụrụ na anyị lezie anya, anyị ga-ahụ ọtụtụ ihe na eme ma nke ọma ma nke ọjọọ. O kwesiri ka anyị nile gbakọọ aka ọnụ wue ebe dị mma nye onwe anyị.
Dịka okwu a sịrị dị, ọ bụghị naanị maka ụmụnwaanyị kama ọ bụ ma nwoke ma nwaanyị. Nke a ga-eme ka udo dị n’akụkụ nile na mpahara nile.
Isi okwu nke ‘International Women’s Day’ nke afọ a bụ “Think Equal, Build Smart, Innovate Change’. Kemgbe ọtụtụ afọ ebidoro mmemme ụmụnwaanyị a, ọtụtụ isi okwu ka e jigworo mee mmemme a, isi okwu ndị a na-eme ka ihe na-aga nke ọma.
Mmemme a dịka a na-eme ya gburugburu ụwa nile, bụ maka ịkwado ụmụnwaanyị na mbọ ha na agba na inye aka wulite odinala nakwa ọchịchị gọọmentị na mba ụwa. Mmemme nke ụmụnwaanyị malitere n’afọ 1911 bụ nke otu nde mmadụ pụtara sonye na ya bụ mme.
Na ‘mba America, ha na-eme nke ha n’ụbọchị ụka ikpeazụ n’ọnwa nke abụọ n’afọ ọ bụla. Ndị Russia n’eme nke ha na Satọdee ikpeazụ n’ọnwa nke abụọ kwa afọ.
N’afọ 1914, Germany mere nke ha na ‘March’ 8. kemgbe ahụ, mba nile na emezi nke ha na abalị asatọ nke ọnwa atọ kwa afọ ọbụla. Ndị UN mere mmemme nke ha n’afọ 1975, o ruo n’afọ 1977, UN wee kpo oku ka a na-eme mmemme a n’abalị asatọ n’ọnwa nke atọ kwa afọ ọbụla.
Ọ bụ kemgbe a malitere nyebe nwaanyị ohere igụ akwụkwọ otu o kwesiri na ịlu ọlụ mkpata ego ka ezinaụlọ na obodo malitere nwebe ezi mgbanwe. Ụmụnwaanyị na-agba mbọ dị iche iche n’ezinaụlọ ma na mmepe obodo.