ÒTÙ ‘Good Governors Ambassadors of Nigeria’ (GOGAN) emeela oke oriri na ọñụñụ dara ụda maka nturu ugo onyeisi ala Nigeria bụ Muhammadụ Buharị na nhọpụta izugbe ahụ e mere n’abali iri abụọ na atọ nke ọnwa Febrụwarị nso nso a.
N’okwu ya na mmemme ahụ, onye chikọbara ya bụ oriri na ọñụñụ ma bụrụkwa onyeisi otu GOGAN, bụ Maazị Johnobosco Ọnụnkwọ kọwara ya bụ nturu ugo Buharị dịka nturu ugo nke ụmụafọ ala Nigeria niile n’izùgbe, ma kwuo na nke ahụ bụ nnọọ ntọpụ n’agbụ nye ụmụafọ Nigeria nke ugboro abụọ. O mere ka a mara na ọ bụ Chineke nna jiri aka ya wee guzobe Buharị n’oche site n’inye ya mmeri nke ugboro abụọ ahụ, iji wee chịkwuo ala Nigeria afọ anọ ọzọ, ma sị na nke ahụ kwesiri ịbụ obi añụrị na ihe oke oriri na ọñụñụ nyere onye ọbụla bụ ezi nwaafọ ala Nigeria.
Maazị Ọnụnkwọ gara n’ihu kpọpụtasịa ụfọdụ n’ime ihe dị iche iche onyeisi ala Buharị meputagoro kemgbe afọ ole na ole ọ nọgoro n’ọkwa, nke gụnyere itute na inwògharị ọnọdụ akụnụba ala Nigeria, ibu agha megide mpụ, arụrụ ala na ịmazụ ego ọhanaeze, idozigharịsị okporo ụzọ dị iche iche, imemìla mkpamkpa ndị Boko Haram, igbochì nsogbu na-adapụta n’etiti ndị ọrụ ugbo na ndị Fụlani na-achị ehi, iweputa atụmatụ itinye ego Nigeria n’otu akpa ego bụ ‘Treasury Single Account’ (TSA), atụmatụ ịzụ ụmụakwụkwọ nri, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ, ma kwuo na ihe ndị a niile so n’ihe gbaara ya akaebe n’oge ọ na-achụ nta nkwàdo, nke mezịrị ụmụ Nigeria jiri tụnyere ya nkwádo n’ụzọ dara ụda.
Ọ chetaara ụmụafọ Igbo ịhụnanya Buharị nwere n’ebe ha nọ, gosipụta ezi olile anya o nwere na ọ ga-enyefe ha ọkwa n’aka n’afọ 2023, ma kpọkuo ha ka onye ọbụla gaa n’ihu ịkwàdò ọchịchị ya, ọbụnadị ka ọ rịọrọ ka onye ọbụla pụta n’ìgwè ma tụnyere ndị niile dị iche iche ji aha otu ndọrọ ndọrọ All Progressive Congress azọ ọkwa dị iche iche na nhọpụta ahụ a ga-eme ụbọchị Satọdee.
N’okwu nke ha n’otu n’otu, ode akwụkwọ otu ndọrọndọrọ APC na steeti Anambra, bụ Maazị Chuks Agụfụgo; onyeisi ndị ntorobịa otu ndọrọ ndọrọ ahụ na steeti ahụ, bụ Maazị Augustine Mụọmaife, na otu onye ọzọ selitere isi n’otu ndọrọ ndọrọ ahụ ma bụrụkwa kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na steeti ahụ, bụ Maazị Jerry Amilo kọwara mmemme ahụ dịka ihe iji sị ndị mmadụ daalụ maka ịtụrụ onyeisi ala Buharị akwụkwọ, ma rịọkwa ha ka ha gaa n’ihu ịkwàdo ya na otu ndọrọ ndọrọ APC.
Ha kọwara Buharị dịka nwoke maara nke ekwe na-akụ n’ihe gbasaara ọchịchị obodo, kwuo na o wulitela ọnọdụ mmepe ala anyị n’ụzọ pụtara ihè, kwàlite ọnọdụ akụnụba ala anyị, ma mepùtekwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ a na-ahụ anya na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria, nke ndị Igbo ritere ọtụtụ uru na ya n’ụzọ dị iche iche. Ha rịọkwara ka ụmụafọ ala Nigeria gaa n’ihu ịkwàdò otu ndọrọ ndọrọ ahụ iji hụ na ọrụ ọma ahụ gàrà n’ihu, ma mekwa ka nkwà ahụ e kwèrè inyefè ndị Igbo ọkwa ọchịchị ala anyị n’ahọ 2023 pụtara ìhè.